Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

ỤBỌCHỊ 4 NKE 12

Mkpọrọgwụ Nke Jesi: Onye Na-eme Udo Nye Mmadụ Niile.

Sitere Na Sabrina

AKỤKỌ
Mgbe m bụ nwata, enwere m nwa nkita maara ihe nke ukwuu. O nweghị eriri m ji adọkpú ya n'ihi na ọ maara otú esi anọ m nso. O nwere ike ịpụ ụbọchị dum gaa n'ebe dị anya ịga gwuritá egwú, mana ọ maara ụzọ esi alaghachita n'ụlọ anyị. Ọ bụ anụ egwuregwu, na-agbó ujá naanị iji chebe ụlọ anyị, ikụkwà ya ekụ̀ na-amasị ya nke ukwuu . . . ruo otu ụbọchị ọ wakpọrọ wee rie nwa nnụnụ dị na be anyị! Isì gịnị? Ee, nwa nkita m n'enye m obi ụtọ ma mara ihe nke ukwuu riri nwa nnụnụ bụ ihe mmeri nwanne m nwanyị nwetara dị ka onyinye Ekeresimesi. Obi jọrọ m njọ ma dị m oké mwute. E bere m ákwá ọtụtụ ụbọchị. Apụghị m ịghọta ihe kpatara nwa nkita m n'enye m obi ụtọ na nwa nnụnụ na-adịghị ihe ọjọọ ọbụla o mere enweghị ike ibi n'udo.

OKWU CHINEKE
GụọAịzaya 11:1–9.

TỤLEE NKE A
Cheregodí, isì gịnị? Na wolfụ na atụrụ ga ebikọtá? Na agụ na ewú ga-edinakọta ala? Na ọdụm na nwa-ehi mara abụba ga-erikọta nri ma nwa-ntakịrị ga-abụ onye ndú ha? Kedụ ihe ndị a pụtara? Olee otú ha ga-esi kwe omume?

N’Aịzaya 11, onye amụma kwuru maka alaeze udo nke Mezaya ahụ ma kọwaa otú ọ ga-adị kà anyị na Jizọs ibikọ́ ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe nke a dị ezigbo egwù! Mana, kedụ ụdị udo bụ nke a nke nà ụmụ anụọhịa na ụmụntakịrị ga-ebikọ́ ọnụ n'udo zuru okè? Ụdị udo a agaghị ekwe anyị nghọta n'uju ugbu a, mana otu ụbọchị anyị ga-ahụ ma bie ya mgbe anyị na Jizọs Kraịst nọ, Onye naanị Ya bụ olileanya na udo anyị. Ma ee, anyị ga-ahụ udo n'etiti mba gasị, mmadụ dị iche iche, ọbụna ndị iro. Ezi udo ga-adị n’ụwa. Mgbe nke a mere, ọ dịghị onye ga-emejọ ma ọ bụ mebie ihe ọ bụla. Chineke ga-eme ma n'eme ihe ndị nyiri omume, Ọ ga-ewetakwara mmadụ niile udo, ọbụna n’etiti ụmụ anụmanụ!

MEE NKE A
Taa, depụta ihe ole na ole ị ga-eme iji weta udo nye otu onye. Ị nwere ike ide akwụkwọ-ozi mara mma nye otu okenye ị maara, ma ọ bụ kpọọ nne na nna ochie gị n'ekwentị iji kelee ha, ma ọ bụ gị na onye agbata obi gị emee kukị. Họrọ otu n'ime ihe ndị a wee rịọ ezinụlọ gị ka ha nyere gị aka ịbụ onye n'eweta udo nye mmadụ ibe ya.

KPEE EKPERE
Ezigbo Chi m, daalụ maka udo nke Ị ga-ewetara mmadụ niile. Daalụ na n'agbanyeghị na m aghọtachaghị ụdị udo nke ahụ bụ, a pụrụ m inwe ntụkwasị obi na Ị ga-eme ka ụzọ dị mgbe a n'enweghị ụzọ. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Calvary Chapel Ft. Lauderdale maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://CalvaryFTL.org/Bible-Plans