Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

ỤBỌCHỊ 2 NKE 12

Ihe Niile Maka Chineke

Sitere Na Janice

AKỤKỌ
Otu ogologo oge nke somà, naanị ihe m nwere ike iche bụ na achọrọ m NKE ukwuu ígwè dị ọhụrụ, na-egbuke egbuke! Ọ dị ka ụmụaka ndị ọzọ niile nọ n'ebe m bi nwechara ígwè kachasị maa mma, dị ọhụrụ, na kacha egbu maramara. . . mana ọ dịghị nke m nwere. Kwa ụbọchị, ndị enyi m niile na-ezukọta iji gbaa ịnyịnya ígwè ha mara mma n’okporo ámá m. Akpọrọ m ígwè nke m asị̀. Achọrọ m nke ọhụrụ NKE ukwuu. Nne m na nna m gwara m na ha pụrụ igotere m naanị aka ígwè ọhụrụ. Otú ahụkwa ka ha mere. Ha goteere m aka ígwè mara mma nwere ihe ịchọ mma toro ogologo na-akpụ n'ala, mana nke ahụ emeghị ka obi dị m mma. A dịghị m ekele maka ha ma ọlị. M nọgidere n'atamụ, n'enwe obi ọjọọ na n'akpọ ígwè m asị̀.

Amaghị na n'oge somà ahụ niile m nọ n'ewe iwe ma obi ana ajọ mụ njọ, na e nwere ígwè dị ezigbote ọhụrụ na-acha uhie uhie n'ime elu ụlọ anyị nọ n'echere m—ihe m n'atụghị anya e gotere m maka ememe ụbọchị a mụrụ m.

OKWU CHINEKE
GụọNdị Rom 8:28–29.

TỤLEE NKE A
Ị̀ che na Chineke nwere ike ime ka ihe ndị na-adịghị mma ghọọ ihe ndị magburu onwe ha? N’ime Akwụkwọ Nsọ, a sị na Chineke na-arụ ihe nile maka ọdịmma ndị hụrụ Ya n’anya. Mana mgbe ụfọdụ anyị anaghị aghọta nke ahụ; anyị adịghị ahụ ya mgbe ihe anaghị aga nke ọma. Aghọtaghị m ihe kpatara e nweghị m ike inweta ígwè ọhụrụ oge somà ahụ. Mana, ị ma nke a? Chineke maara m site na mmalite na Ọ makwa ihe ịtụnanya na ngozi na onyinye niile O nwere maka m. Chineke pụrụ ọbụna iji oge ọjọọ na ndụ anyị mepụtara anyị ihe dị mma—n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu! Chineke pụrụ igwakota ihe ọma na ihe ojoo nke ndụ anyị ọnụ iji mepụta ihe ọma maka anyị.

MEE NKE A
Ụnyaahụ, Nick kwuru banyere oge mbụ o mere keekị. Taa, anyị chọrọ ka gị na ezinụlọ gị mee keekị. Tupu gị agwakọta ihe niile ọnụ, kwụsị ma lelee ihe niile dị iche iche iji eme yabụ keekị: ntụ ọka, na mmanụ, na àkwá. Ha gà-adị ụtọ ma ọ bụrụ na gị erie ha niile n'otu n'otu? Mbanụ! Mana mgbe a gwakọtara ihe niile ọnụ, ọ na-atọ ezigbote ụtọ!

Chineke dị ike iwere ihe ọma na ihe ọjọọ niile nke ndụ anyị wee gwakọta ha ọnụ maka ọdịmma anyị—maka ihe ga-abara anyị uru! Chineke pụrụ ịgbanwe iché maka ígwè ọhụrụ ka ọ ghọọ ihe ọma!

KPEE EKPERE
Ezigbo Jizọs m, nyere m aka ịtụkwasị Gị obi ma ka n'ekele Gị ọbụna mgbe ihe dị ka ha anaghị agazi ofuma. Ekwenyere m na Ị na-eme ka ihe niile na-arụkọ ọrụ ofuma maka ọdịmma m n'ihi na Ị kpọrọ m ma hụ m n'anya. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Calvary Chapel Ft. Lauderdale maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://CalvaryFTL.org/Bible-Plans