Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

O Bịanụ, Ndị Niile Kwerenụ̀ Na Chineke
Bịanụ hụ Ya,
A mụrụ Eze nke Ndị-Mmụọ-Ozi;
O bịanụ, ka anyị nye Ya nsọpụrụ-òfùfè
Nsọpụrụ-ofufe bụ okwu na-amasị anyị iji mee ihe n'oge Ekeresimesi n'ihi egwú Ekeresimesi a ama-ama bụ O Bịanụ, Ndị Niile Kwerenụ̀ Na Chineke, ka anyị na-abụ, "Bịanụ, ka anyị nye Ya nsọpụrụ-òfùfè." Ọtụtụ n’ime anyị n’oge Ekeresimesi na-ewepụta oge n'eche echiche banyere Kraịst na n'enye Ya òfùfè karịa oge ọ bụla ọzọ n’afọ. Chegodí echiche banyere nke a nwa oge. Ọtụtụ ndị mmadụ n'aga ụka n'oge Ekeresimesi karịa oge ọ bụla ọzọ n'afọ. Anyị na-ahụkwa onwe anyị ka anyị n'enwe mmasị ịgụ egwú ma n'ege egwú otitó banyere Jizọs n’oge Ekeresimesi karịa oge ọ bụla ọzọ n’afọ. N’ihi ya, Ekeresimesi bụ oge na-atọ anyị ụtọ ito Ya, ikwanyere Ya ùgwù, na ịsọpụrụ Ya nke ukwuu n’ụzọ Ndị Filipaị 2:9-11 si akọwa.
Ọ bụ ihe magburu onwe ya na Kraịst na-enweta ọtụtụ nkwanye-ùgwù na nsọpụrụ-òfùfè anyị n'oge Ekeresimesi, ọ dịkwa mkpa icheta na anyị kwesịrị ị na-enye Ya oké ùgwù ahụ ma n'etinye Ya n'uche anyị ọnwa iri na abụọ kwa afọ kama ime nke a naanị n'otu ọnwa. N'ezie, ọ dị mfe ibu ihe Ekeresimesi n'isi wee n'etinyekwu oge n'eche echiche, na-abụ abụ, n'ekpe ekpere, na n'asọpụrụ Kraịst n'oge Disemba, mana iji nwee ezi mmekọrịta nke anyị na Kraịst, anyị kwesịrị ịsọpụrụ Ya na nọnyere Ya n'oge niile n'afọ. N'afọ a, ka ị na-esi n'oge Ekeresimesi apụ wee baa n'obibi ndụ nkịtị, gbaa mbọ hụ na ijigidesịrị mmụọ Ekeresimesi ahụ ike ka o wee nyere gị aka ịsọpụrụ Ya ma n'etó site n'enyemaka Ya, ụbọchị niile nke ndụ gị.
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ihe ndị n'egbochi gị ịsọpụrụ na iso Kraịst na-anọkọ kwa ụbọchị?
Kedụ ihe ndị ịga-eme iji hụ na ị na-ewepụta oge ka gị na Kraịst n'anọkọ kwa ụbọchị?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church