Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Gaa Kwusaa Ya N'elu Ugwu
Ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ tụrụ egwù ma maa jijiji
Mgbe lee! na mbara igwe
Ka ukwe ndị mmụọ ozi tirì ka mgbịrịmgba
Ukwe mere ka a mata ọmụmụ nke Onye-Nzọpụta anyị
Oge mbụ nwanyị chọpụtara na ọ dị ime, ọ na-ejupụta n'ọṅụ ma na-achọ ụzọ kasị mma isi gwa di ya, na zie ndị enyi ya na ezinụlọ ya ozi ahụ. Mgbe nwoke dị njikere ịgwa onye ọ hụrụ n'anya na ọ chọrọ ịlụ ya, ọ ma na ya aghaghị ịchọta ụzọ ziri ezi isi jụọ ọdị n'obi ya ajụjụ ahụ na gwa ndị ikwu ya na ya ahụla onye ya chọrọ ịlụ.
Mgbe ụfọdụ, okwu nwere ike ịghara ịkọwa eziokwu nke ozi dị mma n'ụzọ zuru ezu. Ya mere, mgbe Chineke dị njikere ịkpọbata Jizọs n’anụ ahụ́ n’ụwa, olee otú O si weta Ozi Ọma ahụ? N’ihe ngosi kasịnụ, “oké ìgwè” ndị mmụọ ozi pụtara n’ihu ndị ọzụzụ-atụrụ ndị yiri ka o nweghị ihe eji ha kpọrọ, na mbara ala ana-amaghị ebe ọ dị. Ìhè dị nsọ nwudarà ma olu ha ewee daa ụda - ọ bụ ụdị oké ihe, ihe nkiri dị oké ebube ị ga-atụ anya ịhụ maka mmemme kachasị ukwuu na akụkọ ihe mere eme nke ụmụ mmadụ. Naanị ihe dị ka ọ kwesịghị ịnọ ebe ahụ bụ ndị nọ n'ekiri ihe n'eme (ndị ọzụzụ-atụrụ “dị ka o nweghị ihe eji ha wee kpọrọ), na ole na ole n’ime ha nwere ike ịbụ ndị nọ ebe ahụ. Mana eleghị anya nke ahụ na-egosi na anyị kwesịrị igba ezigbo mbọ na mee ihe niile anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-ekwusa ozi dị otú a.
Mgbe Jizọs malitere izi ozizi Ya, ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka O jiri gbasaa Ozi Ọma. Ndị-ìsì hụrụ ụzọ, ndị-ngwurọ jere ije, ndị nwụrụ anwụ si n'ọnwu bilie — ihe ndị a niile ka e mere iji mee ka ndị mmadụ mata, n'ụzọ ikwu okwu n'apụghị ime, ihe Ozi Ọma ahụ pụtara na uru ya.
Aịzaya 62 n'eti mkpu, sị: “Gwa ụmụ Izrel, sị, 'Lee Onye Nzọpụta unu na-abịa.” Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ Ya iwu ka ha gaa na ọgwụgwụ na njedebe ụwa zie ozi Ya. Na n'ime egwú nke n'akwalite ime mmụọ ama ama, a na-arịọ anyị ka anyị “Gaa kwusaa ya n'elu ugwu, n'elu ugwu nta na ebe niile! Gaa kwusaa ya n’elu ugwu, na a mụọla Jizọs Kraịst!”
Ajụjụ Gasị:
Ị̀ ji ike gị, olu gị na ihe ị nwere n'ekwusa Ozi Ọma? Gịnị mere iji n'eme ya ma ọ bụ gịnị kpatara iji ị dịghị eme otú a?
Ọ̀ dị ụzọ dịnụ ị pụrụ iji kesaa Ozi Ọma n'ụzọ dị ike karịa okwu-ọnụ?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church