Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 19 NKE 25

Abalị Dị Nsọ

Gbụonụ̀ ikpere unu n'ala, nụrụnụ̀ olu ndị mmụọ-ozi!
Abalị dị nsọ, abalị mgbe a mụrụ Kraịst!


N’etiti ezughị okè gasị, a pụrụ iwere abalị a mụrụ Kraịst dị ka otu n’ime abalị kasị zuo okè n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Chineke ji ọnọdụ siri ike (ime njem nke a dokpụ̀ ịnyịnya-ibu nwaanyị dị ezigbote ime nọ̀ ọdụ n'elu ya) na ebe na-adịghị mma (ahụghị ọbụlagodi ọnụ-ụlọ nkwari akụ, mana ihe ahụrụ bụ ọba nke nwere naanị ụlọ ụmụ anụmanụ ji eri nri na ehi ụra) weta Ọkpara Ya zuru okè na nke dị nsọ n'ụwa. Chineke pụrụ ime ka ọmụmụ Jizọs bụrụ nke mmeri n'ụzọ dị mfe, mana Ọ họọrọ ịghara ime ya.

Otù Chineke si kpọbata nwa Ya n’ụwa bụ otu ụzọ O si arụ ọrụ n’ime ndụ anyị. Ọtụtụ mgbe, Chineke n'ewere ezughị okè dị adị na ndụ anyị wee jiri ha mee ka anyị zuo okè. Ọ na-atọ Chineke ụtọ ịgbanwe ọnyá anụ-ahụ na nke mmetụta-uche anyị wee jiri ha n'etó anyị ka anyị bụrụ ndị siri ike. Ọ chọkwara ka anyị were ihe anyị mụtara n’ezughị okè anyị wee jiri ha nyere ndị ọzọ aka na-alụso ụdị ihe ndị ahụ ọgụ.

Jizọs bụ ìhè nke kpughere Chineke nye mba nile, anyị pụkwara igosipụta otu ìhè ahụ. Ekwela ka ezughị okè gị mee ka ị ghara ịrụ ọrụ gị ka ìhè. Kama, kwe ka Chineke jiri ha kpụzie gị ka ị bụrụ ụdị onye O kere gị ịbụ́, nke ị bụ ìhè n’ime ụwa gbara ọchịchịrị. Nye Chineke adịghị ike gị gasị ka O wee tụgharịa ha ka ha bụrụ ike kachasị bara uru nye gị.

Ajụjụ Gasị:

Olee adịghị ike gị gasị ọ dị mkpa ka ị nye Chineke ka O wee mee ka ị zuo okè?

N'ụzọ dị aṅaa ka ị na-ahụ onwe gị dị ka ìhè iji kpughee eziokwu Chineke nye ndị ọzọ?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church