Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
Aṅụrị Diirí Ụwa
Añụrị diirí ụwa, Onye-nwe-anyị abiawo!
Ka ụwa nabata Eze ya.
Isaac Watts dere "Añụrị Diirí Ụwa" na 1719. Kemgbe ahụ, n'oge Ekeresimesi ọ bụla, ndị n'agụ egwú Ekeresimesi na-atụpụ okwu ndị ahụ n'ikuku dị ka ụzọ ndụ n'ime oké osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ma "azụ" ọ bụla na-achọta ihe n'adọrọ mmasị ya na ihe ọ pụrụ itụchatụ̀. Ihe ụtọ nke olileanya dị́ n'ime ozi ahụ na-apụta wee metụ ụwa ike gwụrụ aka jiri itụ-anyá nke iracha ihe dị mma n'ezie!
Ọṅụ bịara n’ụwa n’ihi na Chineke, Onye Okike anyị dị ukwuu, hụrụ ihe ndị O kere eke n’anya nke ukwuu nke na O zitere Ọkpara Ya ka O bịa kpughee akụkọ Ya, ka o wee bụrụ na ka oge na-aga, a ga-amata àgwà Ya na ezi uche Ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Mmetụta nke ọmụmụ Kraịst nwerè n’ụwa a agaghị ebelata ma ọlị n’agbanyeghị mgbalị ndị iro n'eme iji kwụsị ya. Jọn 21:25 kwuru na ụwa agaghị enwe ike ibu akwụkwọ ndị e nwere ike ide banyere ihe Onye-nwe-anyị mere mgbe Ọ nọ n’ụwa. Kemgbe ahụ ruo ugbu a ọtụtụ ọgbụgba-àmà gasị nke ịhụnanya Ya na-agbanwe agbanwe abụwo nke e dere ma ka n'edé.
Nehemaịa 8 dekọrọ na Nehemaịa, ndị ndú, na ndị mmadụ ji nnukwu ọn̄ụ mee Mmemme Nke Ụlọikwu, mgbe ha kwusasịrị Okwu Chineke. N'oge a, anyị onwe anyị pụkwara ịṅụrị ọṅụ! Anyị na-aṅụrị ọṅụ ka anyị n'echeta ọmụmụ nke Onye-nzọpụta, nzube Ya, na ihe nketa Ya.
Ajụjụ:
Kedụ ihe ị ga-aṅụrị ọṅụ maka ya n'oge Ekeresimesi a?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church