Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
Nweere Onwe Gị Obere Ekeresimesi Jupụtara N'aṅụrị
Nweere onwe gị obere Ekeresimesi jupụtara n'aṅụrị, Ka obi gị ghara inwe nsogbu ọbụla.
Site n'ugbu a gaa n'ihu, anyị agaghị ahụzị nsogbu anyị anya.
Ekeresimesi nwere ike ịdị ka oge nà ọrụ n'adịghị agwụ agwụ ma n'ebuté ezigbo ike ọgwụgwụ, mgbe ụfọdụ. Enwere azụmahịa ikpeazụ n'ụlọ ahịa ụkwụ ndị mmadụ juru ka ájá, igbasi mbọ ike ịchọta onyinye kachasị mma maka onye ịchọrọ inye yabụ onyinye, ịchọ mma nke ụlọ (gụnyere ịlele bọlbụ niile dị n'eriri ọkụ Ekeresimesi iji chọta nke dị n'ezigbo njedebe ya mere ka ha niile ghara inwu), ikechi onyinye kwa onyinye kwa onyinye, ma ọ bụ ikwadó ka ezinụlọ gị ndị ezi bịa were ọnọdụ n'ime ụlọ gị site na mbido ruo ọgwụgwụ ụbọchị. Ọ dị mfe mmadụ ichefu onwe ya na nkwagharí na nchigharí nke Ekeresimesi, na ifunahụ̀ ihe ndị dị mkpa n'ezie.
Anyị hụrụ nke a ka o mere n’akwụkwọ Luk, mgbe Jizọs gara iri ihe n’ụlọ ụmụnne nwaanyị abụọ, bụ́ Meri na Mata. Mata ji oge ya n'emegharí ihe ma n'esi nri, n'ebuputé nri abalị, n'ehichakwa ihe. Ihe ndị a niile o n'eme bụ ezigbo ihe, mana ha bụ “ihe ndị n'eme ka mmadụ n'akwaghari ma n'achighari”. Ka Mata nọ n'eme ihe ndị a, Meri nọ n'akụkụ Jizọs n'egere Ya ntị. Mgbe Mata gwara Jizọs ka Ọ gwa Meri ka ọ rụọkwanu ọrụ, Jizọs gwara ya, sị: “Meri ahọrọwo ihe ka mma.”
Jizọs n'agbalị ịgwa anyị ka anyị bie ndụ nke ugbu a ghara isogbu onwe anyị maka ọdịnihu. Ọ dị mma na ị dị njikere ịdị ka Mata, wee hụ na popkọn n'agba kere kere ka o kwesịrị, mana nke ahụ adịghị mkpa ka ị hapụ iji ohere ahụ ka gị na onye òtù ezinụlọ gị ịna adịghị ahụ anya oge niile kparịta ụka mara mma na nke ziri ezi, ma ọ bụ mgbe ihu nwa gị nwukerè na-aṅụrị n'ihi na Santa n'ezie natara akwụkwọ-ozi ya banyere ihe ọ chọrọ, wee nye ya kpọmkwem ihe ọ rịọrọ. Ọ bụghị maka ihe niile anyị kwadoro ime, ndepụta ndị ahụ anyị chọrọ itinye akara mmezu n'ezie, mana ọ bụ̀ maka ihe n'eme n'oge ahụ kpọmkwem.
N'afọ a, efunahụla ihe ka mma. Were ohere ahụ ka gị na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị nwee nnọkọ mara mma na nke jupụtara n'ịhụnanya. Hụ na ichégbughị onwe gị maka ihe ndị ị kwadebere na ị ga-eme, kama hụ ụtọ nnọkọ nke ndị nọnyeere gị. Ka obi gị na echiche gị dị n'ebe ịnọ n'Ekeresimesi a, n'ihi na nke ahụ bụ nke ka mma, ma nweere onwe gị obere Ekeresimesi jupụtara n'aṅụrị.
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ihe ụfọdụ ọ dị mkpa ka ị wepụ na listị gị ahụ iji mee onwe gị ka ị dịkwuo ka Meri?
Kedụ ihe ndị ká mma ị ga-ahọrọ ịbụ akụkụ nke ha n'Ekeresimesi a?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church