Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 7 NKE 25

O Bịa, Bịa Immanuel

Ṅụrịa ọṅụ! Ṅụrịa ọṅụ! Immanuel,
Ga-abịakwute gị, Izrel.


Ka oge na-aga, ndị Izrel mgbe niile hụrụ onwe ha ka ha si n'akụkụ Chineke kewapụ́ - site n'ọrụ ha na omume ha n'adịghị mma. Chineke na-emecha napụta ha, mana ndị-Ya Ọ họọrọ na-agba Ya azụ ọzọ eleghị anya. Ya mere anyị na-ahụ isiokwu abụọ n'adịgide adịgide n'ime Agbà Ochie:

Ndị Izrel, n’agbanyeghị otú ha si gbalịsie ike, na agharipụ́ Chineke.
Chineke nọgidere n'enyere ha aka ma mezuo nkwa niile O kwere ha.

Site n'ọnụ ndị amụma Ya, Chineke kwere ọtụtụ nkwa. Aịzaịa 7:14 na-ekwu, sị: “Ya mere Onye-nwe-anyị n'Onwe Ya ga-enye unu ihe ịrịba ama; Leenụ, nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, unu ga-agụ̀ Ya Immanuel.” Aha ahụ bụ̀ Immanuel, a sụgharịá ya, na-apụta dị ka “Chineke nọnyeere anyị.” Ọ bụ nkwa dị oké ịtụnanya - Onye Kachasị Elu na Onye Okike nke Eluigwe na Ala n'ekwe nkwa ime Onwe-Ya ịbịa dị adị n'anụ ahụ ka Ya na ndị gosipụtara na ha erughị eru ma ọlị, nọkọọ.

N'otu n'ime egwú Ekeresimesi kacha emetụ n'ahụ, "O Bịa, Bịa Immanuel", enwere nsogbu dịnụ ụmụ Izrel nà-agabiga. Ha nọ n’ala ọzọ, nọrọkwa ná nkewapụ n'ebe Chineke nọ ọzọ. Jirí echiche dị́ nlezianya, ha họọrọ ịṅụrị ọṅụ ná nkwa Chineke kwere ha. N’enweghi ihe ọzọ ha ga-agbakwasi ụkwụ, n'etiti obi ịda mbà na owu ọmụma, ha nọ n'echeta ma n'ekwusa nkwa ahụ Chineke kwere ha na Ọ ga-anọnyere ha - ebe ha maara na, n’agbanyeghị àgwà ọjọọ ha na omume ọjọọ ha megidé Chineke, Chineke dị ikwesị-ntụkwasị-obi nye nkwa niile O kwere.

Ọ dịghị onye gaara atụ anya na nwa ọhụrụ nọ n’ime ihe eji enye anụ-ụlọ nri ga-abụ mmalite nke atụmatụ zuru okè nke Chineke “ịnọnyere anyị.” Ma, ọ bụ otù ahụ kpọmkwem ka Chineke si mezuo nkwa Ya.

Ị̀ na-eché ka Chineke mezuo nkwa O kwere gị? Ọ na-adị́ gị kà ịnọ n'ala ọzọ ma ọ bụ na ịnweghị mmadụ? Ṅụrịa ọṅụ! Ṅụrịa ọṅụ! Site n'aka Kraịst, Chineke emeele ka ọnịnọ Ya dị irè nye anyị. Ikwesị-ntụkwasị-obi Ya dị ukwuu karịa ọdịda anyị gasị. Ma ọnụnọ Ya bụ ihe mere anyị ga-eji, ọzọkwa, n'aṅụrị ọṅụ!

Ajụjụ:

Ebe Chineke bụ “Immanuel,” olee otú Chineke si nọnyere gị n’oge ezumike a?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 6Ụbọchị 8

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church