Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
N'ebe Dị Anya N'ime Ihe Eji Enye Anụmanụ Nri
N'ebe dị anya n'ime ihe eji enye anụmanụ nri, o nweghị ihe ndina e nwere maka Ya;
Jizọs a mụrụ ọhụrụ tọgbọ nwa isi ọmarịcha Ya
Eze ndị-eze na Onye-nwe ndịnwenu ka a mụrụ n'ụlọ anụ ma Ọ nweghị chaa ebe ahụrụ ka O jiri debe isi. Obibi ndụ Onye-nwe-anyị dị́ ezigbote umeala na-echetara anyị na anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi na nwee ekele maka ihe e jiworo gọzie anyị. Ezi ihe Ekeresimesi pụtara ka egosipụtara n’ụzọ mara mma n’akụkọ ọmụmụ Jizọs nke na anyị aghaghị ijupụta na ekele maka ihe nile e nyere anyị n’ụbọchị ahụ.
Abụ ahụ kọwara otú ọbụna mgbe Jizọs tetara n'ụra, Ọ naghị eti mkpu ma ọ bụ mee mkpọtụ. Ubọchị ahụ bụ ụbọchị ọńụ, ma nwa ahụ mụ́ anya dina n'elu nri ụmụ anụmanụ abụghị nwa nkịtị, Ọ bụ Onye-Nzọpụta nke mmadụ! Mkpụrụ-okwu ikpeazụ nke abụ ahụ na-arịọ Onye-nwe-anyị ka Ọ nọrọ n’akụkụ anyị, ka O duo anyị, na kpọrọ anyị mgbe e mechara laa n'eluigwe ka anyị na Ya biri. Ugboro ole ka anyị n'ekpe ụdị ekpere ahụ? Nọnyere m, Onye-nwe-anyị, ka m n'eje ije ndụ n'ụwa a.
Lee ka ọmụmụ Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst si dị ebube na maa mma. Anyị n'eme ememe ọmụmụ Ya na ndụ nke O nyere anyị site na ndụ, ọnwụ, na mbilite n'ọnwụ Ya.
Ajụjụ Gasị:
N’uche gị, olee otú egwú Ekeresimesi a si egosipụta ịhụnanya nke Kraịst?
Gịnị ka egwú Ekeresimesi a n'egosi gị gbasara Onye-nwe-anyị ná mmalite nke ndụ Ya n’ụwa?
Gịnị ka ị che kpatara Chineke ji họrọ ka a mụọ nwa Ya nwoke n'ihe eji etinyere anụ-ụlọ nri kama ikwe ka a mụọ Ya ọmụmụ kwesịrị nke eze?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church