Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 12 NKE 25

Geenụ Ntị! Ka Ndị Mmụọ Ozi Na-abụ̀

Ọ dị nwayọọ wee debe ebube Ya n'otu akụkụ;
A mụrụ ka ihe akpọrọ mmadụ kwụsị ịnwụ.
A mụrụ ikpọlite ụmụ nke ụwa;
A mụrụ inye ha ọmụmụ nke abụọ.


Ọ bụ ihe na-atọ ụtọ ile nwa ọhụrụ a mụrụ anya ma chee ihe ọ ga-abụ ma o tolite. O nwere ike ịbụ ihe ọ bụla – onye na-anya ụgbọelu, onye uwe ojii, onye n'esi nri, onye na-enyocha mbara igwe, onye ụkọchukwu, ma ọ bụ otu nde nhọrọ ndị ọzọ. Ọdịnihu nwa ọhụrụ ahụ mepere emepe ma jupụta na nhọrọ na ohere dị iche iche.

E ji otu nzube wee mụọ Jizọs. Dị ka ekwuru na egwú Ekeresimesi ahụ, “a mụrụ ka ihe akpọrọ mmadụ kwusi ịnwụ.” Ọmụmụ Ya bụ maka ọmụmụ ọhụrụ anyị. Na 1 Pita 1:3, Pita na-eto Chineke maka “ọmụmụ ọhụrụ baa n’olileanya dị ndụ” – ma ihe niile ahu kwere omume n’ihi na Jizọs dobere ebube Ya n’otu akụkụ wee nyefee onwe Ya n’ọnọdụ anyị, n'ewere ntaramahụhụ ọnwụ nke kwesịrị anyị maka mmehie anyị. Ọnwụ Ya na mbilite n’ọnwụ Ya na-enye anyị ndụ ọhụrụ. Ka ị na-eme azụmahịa gị na ọrụ gị nke oge a, kpachara anya wepụta obere oge iji kwụsịlatụ wee cheta na a mụrụ Jizọs ka e nye GỊ ọmụmụ nke abụọ. Nke a o kwesịghị iji nye Ya nnukwu otito!

Ajụjụ Gasị:

Kedụ otù i si egosipụta ekele gị nye Jizọs maka ndụ ọhụrụ Ọ na-enye gị?

Ònyé n’ime ndụ gị ka na-aghọtabeghị ezi ihe kpataranụ e ji mụọ Jizọs? Kedụ ihe ị ga-eme iji mee ka ha ghọta eziokwu nke ọmụmụ Ya?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 11Ụbọchị 13

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church