Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Egwú Ekeresimesi Ahụ̀ Ama Ama
Mkpụrụ osisi ana ata-ata n'ahụ ọkụ n'elu ọkụ a n'ekpuchighị ekpuchi,
Jack Frost n'adú gị chím chím n'elu imi gị,
Ndị otu ukwe na-agụ́ egwú Ekeresimesi gasị,
Ndị mmadụ ejikerechaa dị ka ndị Eskimo.
Ọ bụrụ na enwere otu egwú nwere “Mmụọ Ekeresimesi” ọ bụ egwú a. Ọ na-eme ka uche anyị gbagaa na ihe nkiri sitere na eserese Norman Rockwell. Mà ọ̀ bụ̀ anyị eji anya uche anyị hụ ndị n'eme njeghari na-agụ egwú Ekeresimesi ka ha bịara kwuru n'ọnụ ụzọ anyị, anyị enye ha apụl saida esiri ofuma dị ụtọ dị ọkụ. Anyị agaa n'ụlọ ndị enyi anyị rie oriri na ọṅụṅụ ma gaa n'ụlọ ụka gaa kpeere Chineke. Ka anyị ghara ichefu anyị na ezinụlọ anyị iyikwasị onwe anyị efè kwà efè na blanketị n'ụtụtụ Ekeresimesi ma ọmarịcha sno a n'ada n'ala.
Ma, n'etiti ọmarịcha echiche anyị ndị a maka Ekeresimesi, ụmụ anyị n'agbabata n'ime ụlọ ebe anyị nọ wee n'eti "Mama!" ma ọ bụ "Papa!" n'ihi na mmadụ kụrụ ha ihe, ma ọ bụ n'ihi na otu n'ime ha jiri égbè mmiri ibe ya wee gwuo egwú ajụghị esè, ma ọ bụ n'ihi na otu n'ime ndị agbata obi ha napụrụ ha basket bọl ha, ma ọ bụ n'ihi na ha si n'elu zip lainụ daa. Ụdị nsogbu na mkpọtụ nke a, maka ihunanya nke ihe niile dị mma na nke ziri ezi n'ụwa, ọ na anyị enweghị ike ịnọkwụ nwa oge n'obere paradaịs Ekeresimesi anyị a, naanị nwa oge?
Nke ahụ bụ ihe anyị na-ahụ na ndụ, ọ bụghị ya? N'agbanyeghị otú anyị si gbalịsie ike ịtọ ahụmahụ na ngabiga nke ndụ anyị, a ga-enweriri ihe ọzọ dapụtara ma ọ bụ dakwasị na ya nke na-abaghị ma ọlị n'ime obi anyị mgbe anyị na atọ ahụmahụ nke ndụ anyị. Ihe n'emebi mkpuzi zuru okè nke foto anyị chebeerè onwe anyị maka ndụ. Ihe na-agbawa obi anyị.
Mmekọrịta chiri-anya kwụsịrịnu.
Onye ezinụlọ a hụrụ n'anya nwụrụnụ.
Nraranye n'afu ufu nke enyi mere anyị.
Ị maarà na ọ dịghị otu n'ime ihe ndị a niile na-akpasu ndụ anyị n'emé, Chineke amaghị na ha ga-eme? Ikwu eziokwu, ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ma Chineke amaghị gbasara ya. Ahụla ihe ọjọọ ọbụla n'eme na ndụ gị dị ka na Chineke enweghịzi ikike ma ọ bụ na Ọ dịghịzi njikwa na ndụ gị. Mbà, ihe ndị ị n'eche ihu abụghị maka ngosipụta ka O si dị ike, kama ọ bụ maka ọbụbụeze Ya n'ihe niile gbasara gị.
N'agbanyeghị ọchịchọ obi anyị ka ihe ọjọọ ghara ime na ndụ anyị, ha ga-eme. Jizọs kwuru na anyị ga-agabiga nsogbu na ntaramahụhụ (Jọn 16:33), mana O kwekwara nkwa na Ọ ga-eme ka obi dajụọ anyị n'etiti ya bụ ihe (Jọn 14:27). Ya mere, n’agbanyeghị ebe anyị nọ na ndụ ugbu a, ma ànyị tụrụ anya na anyị ga-anọ n’ụzọ anyị nọ na ya, ma ọ bụ na anyị atụghị, kwere chịm, na Chineke anyị pụrụ ime ka ihe ndị mebiri emebi na ndị dị njọ nke ndụ anyị tụgharịa ma maa ezigbo mma.
Enyi, anyị maarà na n’ihe niile Chineke na-arụ ọrụ maka ọdịmma gburugburu ndị hụrụ Ya n’anya, ndị akpọrọ dịka nzube Ya si dị (Ndị Rom 8:28). Jiri okwukwe n'azọ̀ ije gị ihu ihu ma tụkwasịe obi gị ike na Onye na-apụghị igharịpụ̀ gị ma ọ bụ kwe ka ị daa mbà.
Ajụjụ:
Kedụ oge na ndụ gị ị hụrụ Chineke na-achị́ ka Eze na dị njikwa n'etiti nrụgide na nchighari ị nọ n'agabiga?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church