Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Noel Nke Mbụ
Ya mere ka anyị niile jiri otu obi
Buo abụ otuto nye Onye-nwe-anyị bi n'eluigwe
Nke mere eluigwe na ala ejighi ihe ọ bụla
Wee were ọbara Ya gbapụta ụmụ mmadụ.
Noel, Noel, Noel, Noel
Amuola Eze Ndị Izrel!
A maara nke ọma na noël bụ okwu French maka Ekeresimesi, mana ị maarà ebe okwu ahụ si malite? Noël sitere na okwu Latịn bụ natalis, nke pụtara “ọmụmụ.” Ya mere, aha nke abụ a, a sụgharịa ya nke ọma, bụ “Ọmụmụ Nke Mbụ.” Abụ a n'akọ akụkọ ọmụmụ Jizọs, ọmụmụ Jizọs dịka anyị na-agụ na Akwụkwọ Nsọ. Ndị mmụọ ozi bịakwutere Josef na Meri, na-agwa ha si, “Meri ga-amụ nwa nwoke, unu ga-agụ̀ Ya Jizọs, n’ihi na Ọ ga-azọpụta ndị Ya na mmehie ha.” (Matiu 1:21).
Jizọs bịara ịzọpụta anyị na mmehie anyị. Nke ahụ bụ ihe oge a bụ nye anyị: ncheta ọmụmụ Jizọs, na ndụ Ya. A mụrụ Ya ebe a, Ya ebie ebe a, nwụọ ebe a, e wee kpọlitekwa Ya n'ọnwụ ebe a, ihe a niile ka e mere ka anyị wee nwee ụzọ ọhụrụ anyị na Chineke ga-esi n'enwe mmekọrịta. Abụ a na-echetara anyị maka olileanya nzọpụta nke so ọmụmụ Jizọs bịa. Anyị na-eme ememe a bụghị naanị maka ndụ ọhụrụ Ọ n'enye, anyị n'emekwa ememe a maka ohere nke ọmụmụ ọhụrụ enyere onye ọ bụla n'ime anyị. A muola Eze anyị! Ọbara Ya ga-eme ka anyị dị ọhụrụ!
Mmehie ọ bụla, erughị eru ọ bụla, ọdịda ọ bụla, adịghị ike ọ bụla i nwere, e nwere nwa a mụrụ, Ọ bịakwara ịzọpụta gị.
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ihe gasị i chọrọ ka Jizọs si n'aka ha napụta gị?
Kedụ ka ọmụmụ Ya ga-esi gbanwee ndụ ndị ị maara n'oge ezumike a? Kedụ ihe ị ga-eme gbasara ya?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church