Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 20 NKE 25

O Obere Obodo Nta Nke Betlehem

O obere obodo nta nke Betlehem, Lee otú anyị si hụ gị nọ jụụ…
N'elu ụra gị miri emi n'enweghị nrọ, Ka kpakpando ndị dị jii na-agafe
Ma n'agbanyeghị nke a n'ámá-gị nile nke gbara ọchichiri ka a n'ahụ onwunwú, Ìhè Ebighi-Ebi
Olileanya na atumanya nke afọ nile, Ka e mezuru n'ime gị n'abalị a


Betlehem bụ obodo a n'ewere dị ka obodo dị obere na nke na-abaghị uru. Maịka 5 kọwara Betlehem dị ka obodo “...dị obere n'etiti mpaghara dị iche iche nke Juda.” Mana Maịka gara n’ihu n'ekwu, sị: “Onye ga-abụ Onye na-achị Izrel ga-esi n'ime gị pụta nye M.” Ka a hụrụ n'anya, a mụrụ Jizọs na Betlehem ihe dị ka narị afọ asaa mgbe e mesịrị.

Uru Betlehem barà, bụ́ obodo a n'ejighị kpọrọ ihe, abụghị nke a pụrụ ikọwapụtachà. Ọ na-amasị Chineke irụ ọrụ n'ụzọ gasị dị ịtụnanya site n'ihe a n'ejighị kpọrọ ihe na nke elegharalà anya. Ọ dị mfe anyị niile inwe mmetụta nke na ejighị anyị kpọrọ ihe, na anyị abaghị uru, mana ụdị onye ahụ bụ kpọmkwem onye Chineke ga-eji wee mee ihe. Chee echiche banyere ụzọ n'adịghị agwụ agwụ nke Chineke nwere ike iji gị wee mee ihe ma ọ bụrụ na ị nyefere onwe gị n'uche Ya.

Ikwu eziokwu, Betlehem nwere ihe ụfọdụ bara uru ejiri wee mara ya tupu a mụọ Jizọs. Gụnyere ihe ndị ọzọ, ọ bụkwa ebe a mụrụ Devid, onye agha na eze Agba Ochie kasịnụ nke Izrel. Otú ọ dị, nke a bụkwa ihe atụ ọzọ nke ọbụbụeze Chineke dị ịtụnanya. Devid bụ nwoke ikpeazụ Jesi mụrụ, bụ́ onye weere ya dị ka onye ana-atụghị anya ya ịbụ eze n'ime ụmụ ya. Ma Chineke hụrụ ihe ahụ niile wee mee ka e tee ya mmanụ ịbụ onye ọchịchị ọzọ nke ụmụ Izrel. Ọzọ, Chineke nọ na-arụ ọrụ n’ụzọ na-abụghị nke amamihe nke mmadụ.

Anyị na-ahụkarị ndụ anyị na ọnọdụ anyị site n'otu mmadụ si eche echiche. Ozugbo anyị ghọtara na Onye-nwe-anyị na-arụ ọrụ n'ụzọ dị omimi nke dị elu karịa nke anyị, anyị ga-adịkwu njikere maka Ya iji anyị mee ihe n'ụzọ dị ụtọ na n'enye aṅụrị.

N’ezie ọ dịghị ihe dị mkpa karịa ọmụmụ, ndụ, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst. Lee ka o si gbaa uche gharii na ọ ga-amalite n'otu abalị dị jụụ na nke dị udo, n'obodo dị jii na nke dị nrọ̀. “Ìhè Ebighị Ebi” ahụ, “olileanya na atumanya nke afọ nile” malitere na “…Obere Obodo nke Betlehem.”

Ajụjụ Gasị:

Kedụ ka ị siri hụ kà Chineke n'eji ndị mmadụ na ihe ndị yiri ka ha enweghị isi mee ihe ebube na ndụ gị ma ọ bụ na ndụ ndị ọzọ?

Ọ dịtụla mgbe elegharala gị anya? Olee mmetụta nke ahụ nwere n'ahụ́ gị?

Kedụ ihe ị ga-eme iji kwe ka Chineke jiri gị mee ihe n'ụzọ dị ịrịba ama?
Ụbọchị 19Ụbọchị 21

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church