Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
Ndị Mmụọ Ozi Siteré N'Alaeze Nke Ebube
Ndị mmụọ ozi siteré na alaeze nke ebube,
Jirí nụ nkù unu fegharia n'elu ụwa niile;
Unu bụ ndị bụrụ abụ akụkọ okike,
N'ekwupụtá ugbu a ọmụmụ Mezaiya:
Bịanụ kpọọnụ isi ala,
Bịanụ kpọọnụ isi ala,
Kpọọnụ isi ala nye Kraịst, bụ́ Eze a mụrụ ọhụrụ!
Omume nke ndị mmụọ ozi bụ̀ otu n'ime akụkụ kacha atọ ụtọ nke akụkọ Ekeresimesi sitere na Luk 2. Nke mbụ, mmụọ ozi pụtara n'ụzọ ana atụghị anya n'ihu ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ wee gwa ha ozi ọma banyere ọmụmụ Jizọs (Luk 2: 9). Mgbe nke a mechara, dị ka aga-asị na ozubeghị, ìgwè ndị mmụọ ozi pụtara ozugbo n'ihu ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ wee were egwú ọma na olu dara ụda mezuo ihe itunanya na-emenụ (Luk 2:13). Nke a bụ ememe pụrụ iche nke ana-ahutubeghị n’ime Akwụkwọ Nsọ, ma è mekwaghị ya maka ndị ọchịchị, òtù ndị elu nke obodo ahụ, ma ọ bụ ndị ama ama n’ụzọ ime mmụọ, kama e mere ya maka ndị ọzụzụ-atụrụ ana enweghị ihe eji ha wee kpọrọ. Leenụ ndìíche mara mma na ngosi zuru okè nke ike nke Ekeresimesi. Ọ bụ ozi kasịnụ ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịma! Ndị mmụọ ozi ahụ bi n'ihu zuru oké nke Chineke dị ike bụ ndị mere na duzie yabụ ememe, ma n'agbanyeghị nke ahụ, ozi nke mmemme ahụ bụ maka ndị ana enweghị ihe eji ha wee kpọrọ, na ndị ụwa tiwasịrị.
Egwú Ekeresimesi a dị ochie bụ ihe ncheta dị mfe ma dị ike nke ndị niile a kpọrọ òkù ka ha bịa mee ememe ọmụmụ Jizọs na fee Ya òfùfè. Jizọs bụ onyinye kachasị ịtụnanya e nyere anyị. Chineke hụrụ anyị n'anya nke ukwuu nke na O zitere Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya ka Ọ bata n'etiti ihe a kpọrọ mmadụ ka anyị wee nwee ohere mgbe e mesịrị ịbụ ndị ziri ezi n'ihu Chineke dị nsọ. Nke ahụ bụ ike nke Ekeresimesi, ndị mmụọ ozi ahụ ghọtakwara ya. Ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ bụ ndị mbụ nwere ahụmahụ ike a. Ndị nwoke-amamihe ahụ kwenyere na ya. Ọ bụghị naanị na ha sonyere n'ememe òfùfè ahụ, ma obi ụtọ ha na òfùfè ha kpaliri ndị ọzọ ime ka ha si mee. Ekeresimesi a, ka òfùfè anyị bụrụ nke eziokwu na nke na-akpali ime mmụọ nke na anyị ga-adọta ndị ọzọ ka ha “Bịa fee òfùfè; bịa ma fee òfùfè; Fee Kraịst òfùfè bụ Eze a mụrụ ọhụrụ!”
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ka ị ga-esi mee ememe na fee Jizọs òfùfè n'oge Ekeresimesi a?
Kedụ otu ị ga-esi kpalie ndị ọzọ ime ka gị?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church