Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Ume Nke Eluigwe
Ume nke eluigwe, jigidesie m ike mee m ka m ghara ighasà aghasà
Dịrị m nso ruo mgbe ebighị ebi, Ume nke Eluigwe
Ume nke eluigwe, mee ka ọchịchịrị m bụrụ ìhè
Wukwasa m, ịdị-nsọ Gị, N'ihi na Ị dị nsọ
Ume nke Eluigwe
Ọtụtụ n’ime anyị ji Meri nne Jizọs kpọrọ ihe nke ukwuu, n’ihi na Chineke họpụtara ya iburu Ọkpara Ya wee mupụta Ya n’ụwa. Ọ bụ ọrụ kacha ukwuu e nyetụrụla onye ọ bụla. Ọ bụ ezie na anyị ji Meri kpọrọ ihe, mana ọ dị mkpa ka anyị cheta na ọ bụ mmadụ nkịtị dị ka anyị. Ikwu eziokwu, ọ ga-abụ na ụjọ tụrụ ya ma ọ bụ karịa ka o si tuo ọtụtụ ndị. Ọ bụ nwa agbọghọbịa na-alụbeghị di, bụ́ onye tụụrụ ime n'ụzọ ọrụ ebube mgbe otu mmụọ ozi gwasịrị ya na ọ ga-amụ Mezaịa ahụ a tụrụ anya ya. O nwere ike ịbụ na ụjọ tụrụ ya n’ihi nnukwu ọrụ ahụ Chineke nyere ya, nnukwu egwù nwekwara ike jide ya n’ihi okwu ọnụ, àgwà ọjọọ na ebubo ndị mmadụ mere ya na Josef n’ihi afọ ime ya pụrụ iche. Ọ ga-abụ na ụjọ tụrụ ya n’ogologo njem ha ịga Betlehem, ebe ọ bụ na ọ dị ime ọnwa itoolu ma jiri ịnyịnya-ibu n'eme yabụ njem. Otú ọ dị, n'agbanyeghị egwù ya, ọ nọgidere na-atụkwasí Chineke obi ma jiri obi ike ruzuo ọrụ e nyere ya na Josef.
Abụ a bụ Ume Nke Eluigwe n'enye anyị ekpere nke dịka nke Meri kpere na-arịọ Chineke ka O jigidesie ya ike ka ya ghara ighasà aghasà, nọrọ ya nso, na mee ka ọchịchịrị ya ghọọ ìhè. Ugboro ole ka i kpeworo ụdị ekpere a? Ekeresimesi bụ oge eji enwe aṅụrị, mana nke bụ́ eziokwu nye ọtụtụ n’ime anyị bụ na ọ na-esiri anyị ike inweta ọṅụ n’etiti ọgba-aghara na ọnwụnwa niile n'eme gburugburu anyị. Dịka Chineke si chebe ma duzie Meri n’oge ihe isi ike, kwe Ya ka O duzie gị Ekeresimesi a. Kpekuo Ya n'ekpere ma kọsara Ya ihe na-enye mmụọ gị nsogbu, ma kwe Ya ka O weghachita ọṅụ nke Ekeresimesi n'ime gị site n'ijigidesi gị ike ka ị ghara ighasà na tiwasia, ịnọ gị nso ruo mgbe ebighị ebi, na ime ka ọchịchịrị gị wuo ìhọ̀.
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ọnwụnwa-gasị ị na eche ihu ugbu a nke na-anapụ gị ọṅụ Ekeresimesi?
Kedụ ihe ụfọdụ ị nwere ike ime iji nweghachita ọṅụ na olileanya na ndụ gị?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church