Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
Mgbe A Mụrụ Nwa Ọhụrụ
…olileanya ọhụrụ, ndụ ọhụrụ. Ọtụtụ ihe n'abịa na mmezu mgbe a mụrụ nwa ọhụrụ.
N'oge ahụ, onye ọ bụla, n'echefu ike ọgwụgwụ ha na nsogbu ha niile.
Obere ihe a amụrụ ga-agbanwe ndụ ndị mmadụ… ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ dịghị ihe dị ka nzita-ozi nke nwa ọhụrụ a mụrụ, pụrụ iweta obi ụtọ n'ime ezinụlọ. Dị ka egwú ahụ na-ekwu, “...olileanya ọhụrụ, ndụ ọhụrụ. Ọtụtụ ihe na-abịa na mmezu mgbe a mụrụ nwa ọhụrụ. N'oge ahụ, onye ọ bụla na-echefu ike ọgwụgwụ ha na nsogbu ha. Obere ihe a amụrụ ga-agbanwe ndụ ndị mmadụ… ruo mgbe ebighị ebi. ”
Ọtụtụ anya na-elekwasị ụmụ nwaanyị dị ime ebe ọbụla ha gara, ebe ndị enyi ha na ezinụlọ ha n'achọkarị inyere ha aka site na mbido afọ-ime ha ruo na ọgwụgwụ ya. Mgbe ụmụ nwaanyị ndị ahụ dị ime mechara mụọ nwa, o nweghị ihe dị ka mkpu ákwá nwa iji gosipụta ndụ ahụ nọ n'eto ma n'etolite n'ime ọnwa itoolu gara aga, wee n'emepụta ọṅụ dị ukwuu.
Obi ụtọ ahụ nke n'abịa site na ọmụmụ nke anụ ahụ na-apụtakwa mgbe anyị nwetara ọmụmụ nke ime mmụọ n'otu oge ahụ anyị rịọrọ Kraịst ka Ọ bụrụ Onye-nzọpụta nke onwe anyị na Dị Nwenụ nke ndụ anyị. N'ezie, ọtụtụ ndị mmadụ ugbu a n'eme ememe nke ụbọchị ọmụmụ nke anụ-ahụ ha na nke ọmụmụ ọhụrụ ime mmụọ ha n'ihi na ha ghọtara na ụbọchị Kraịst batara ná ndụ ha dị nnọọ mkpa dị ka ụbọchị ha malitere ịdị.
Chee echiche banyere ọṅụ nke pụtara ìhè n’oge a mụrụ Kraịst kemgbe a mụrụ Ya n’anụ ahụ́ n'ihi na ọmụmụ Ya ga-emecha gbanwee ihe kpọrọ onwe ha mmadụ n'ụzọ dị ebighị ebi. Anyị pụrụ inwe ọmụmụ ọzọ nke ime mmụọ n'ihi na a mụrụ Ya n'anụ ahụ. Jọn 10:10 na-ekwu, sị: “Otú Onye… bịara… ka ha wee nwee ndụ, ka ha wee nweekwa ya n'uju.” Anyị nwere ndụ ọhụrụ n’ihi otu nwata: Jizọs. Ka ị na-atụgharị uche n’oge Ekeresimesi a, dị ekele maka ihe Chineke mere site n’izite Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya ka anyị nwee ike nweta ndụ ọhụrụ. Nwee ekele maka abalị ahụ dị nsọ mgbe a mụrụ nwa ọhụrụ ka e wee mụọ anyị ọzọ.
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ihe dugara gị n'ọmụmụ ọzọ nke ime mmụọ gị?
Gịnị ka ndụ ọhụrụ n'ime Kraịst pụtara nye gị?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church