Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 17 NKE 25

Anyị Bụ̀ Eze Atọ Ndị Si Na Orientị

Kpakpando dị́ ịtụnanya, kpakpando nke abalị,
Kpakpando nwere ịma mma nke eze na n'egbuke egbuke,
N'edú anyị n'aga n'ọdịda anyanwụ, ka na-aga n'ihu,
Duru anyị gaa ruo na Ìhè gị zuru okè.


Ọ na-esiri ndị mmadụ ike ịghọta na a mụrụ Jizọs dị ka anyị. A mụghị Ya n'obí-eze akụ juru ma ọ bụ n'ụlọ ọgwụ mara mma. Amụrụ Ya n’èzí, n’ime ihe e ji etinyere anụmanụ nri. Ọ batara n'ụwa nke jupụtara na mmehie, mana O biri ndụ zuru okè n'agbanyeghị nke a. Ọ bịara idu anyị, n'edukwa anyị ka anyị na Chineke n'enwe mmekọrịta ịhụnanya.

Ndị nwoke-amamihe atọ ahụ bụ ezigbo ihe atụ nke nrubeisi zuru okè nye Chineke dị kà. Ozugbo ha hụrụ kpakpando ahụ, ha kwụsịrị ihe niile ha nọ n'eme wee malite ogologo njem nke siiri ha ike n'ezie mgbe ụfọdụ. Ndị nwoke-amamihe atọ ahụ amaghị ebe ha na-aga, mana ha tụkwasịrị obi ha kpam kpam na kpakpando ahụ idu ha. Ha tinyere ihe ha niile n'ịchọ Ya n'agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Dị ka ndị nwoke-amamihe atọ ahụ n’abụ a si soro kpakpando na-egbuke egbuke ịhụ Jizọs mgbe a mụrụ Ya, ọ bụrụ na anyị edobe onwe anyị n’okpuru Chineke, Ọ ga-eduzi ụzọ anyị ma bụrụ Onye-nduzi zuru okè maka ndụ anyị.

Ajụjụ Gasị:

Kedụ akụkụ-gasị nke ndụ gị ọ dị mkpa ka ị nyefee n'aka Chineke?

Gbalịa cheta otu oge mgbe i dorò ma ọ bụ nyefee ihe n'aka Chineke. Gịnị si na ọnọdụ ahụ pụta?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 16Ụbọchị 18

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church