Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Jụụ, Jụụ, Jụụ
Juu, jụụ, jụụ, Á pụrụ ịnụ sno n'adà.
N'ihi na ọ dịghị ihe n'eme mkpọtụ, Ụwa na-arahụ ụra
Kpakpando Dị Nsọ n'echekwa nche abalị ya
Jụụ, jụụ, jụụ, Á pụrụ ịnụ sno n'adà.
Jụụ, jụụ, jụụ… Okwu ndị a adịghị ka ha n'enwe ọnọdụ n'nkwaji na arụmọrụ nke ndụ n'enweghị ezumike, karịsịa n'oge Ekeresimesi. Ememme oriri na ọṅụṅụ, inye ihe na inata ihe gasị, na ọrụ gasị akwadoro ka anyị rụọ n'eme ka anyị n'agbaghari ka anyị n'ekworo gaa ná otu ihe ma ọ bụ mmemme wee gbagaa na nke ọzọ. Ọtụtụ mgbe, tupu anyị amara ya, ụbọchị Ekeresimesi abịala ma gafee. Naanị mgbe ahụ ka anyị na-aghọta na, n’agbanyeghị ezi ebumnobi anyị, ọ dịghị mgbe anyị nwetara udo nke na-abịa site n’ịtụkwasị obi n’ezie n’ịhụnanya dị ịtụnanya nke Chineke nwere n’ebe anyị nọ.
Ọ́ bụghị ihe na-akpali mmasị na Chineke nyere anyị iwu ka anyị “Dọrọ́ jụụ”? Ị̀ chè na ọ bụ n'ihi na Ọ maara na ọ na-esiri anyị ike mgbe ụfọdụ ime ya n'onwe anyị?
Kedụ ihe n'eme mgbe anyị na-ewepụta oge iji nọrọ jụụ? Azịza ya dị n’Abụ Ọma 46:10… “Dịrị́ jụụ, marakwa na Mụ onwe M bụ Chineke: a ga-ebuli M elu n’etiti mba nile, a ga-ebulikwa M elu n’ụwa.” Mgbe ị nọ jụụ n'ihu Chineke, ị ga-aghọta nke ọma na n'agbanyeghị ihe ọ bụla ị na-eche ihu, n'agbanyeghị ihe ọ bụla ụbọchị gị dị kà, ị nwere ike zurú ike zuru ezù n'eziokwu bụ na, Chineke bụ Chi. Ọ dị egwù ma dị ịtụnanya na bụrụ Chi nwe ihe niile. Ọ hụrụ anyị n'anya karịa ka anyị nwere ike ichè n'echiche ma bụrụkwa Chi n'achị n'elu ihe niile.
Jiri obi gị wepụta oge ụbọchị taa na-achụso ịnọ jụụ n'oge dị iche iche. Ị nwere ike wukwasí onwe gị blanketị wee pụọ n'èzí ka ị hụ kpakpando dị na mbara igwe, n'echè ihe kpakpando ahụ dị nsọ dị kà, nke gosipụtara ọmụmụ Kraịst ọtụtụ afọ gara aga. Ị nwekwara ike were nkeji ole na ole lelee obere nwa gị ka ọ na-ehi ụra ma n'echè ka ị na-ele ihu ahụ n'enye gị aṅụrị n'obi, ihe Meri na Josef cherè banyere nwa ha, ha mụrụ ọhụrụ. Mepee Akwụkwọ Nsọ gị, gụọ akụkụ Ya kachasị amasị gị… wee nọdụ jụụ mee nwa ncheré.
Ajụjụ:
Kedụ eziokwu gasị n'ekwú okwu n'ime mkpụrụ obi gị gbasara Kraịst ka ị n'ewepụta oge iji nọrọ jụụ n'ihu Ya?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Carols: A Christmas Devotional](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F203%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church