Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 11 NKE 25

A Ga M Alota Ụlọ Maka Ekeresimesi

Ụbọchị ga-abọ̀ Ekeresimesi ga-achọta m
Ebe ìhè ịhụnanya na-enwu
Aga m alọta ụlọ maka Ekeresimesi
Ọ bụrụgodị naanị na nrọ m


A kọwapụtarà okwu ahụ bụ ụlọ n'ụzọ dị mfe otu a: Ebe mmadụ bi; ntọala amaara nke ọma; ebe mmadụ si. Kedụ ebe bụ ụlọ anyị?

Ụlọ anyị bụ ebe anyị nọrọ ọtụtụ afọ tolite na mee ihe ncheta gasị. Ọ bụ ebe anyị mere nzọụkwụ mbụ anyị. Ọ bụ ebe anyị mụtara ịnya ụgbọ ala. Ọ bụ ebe anyị nwere ahụmahụ ịhụnanya anyị mbụ nke onye dị anyị mma n'obi. Ọ bụ ebe anyị gụchara akwụkwọ sekọndrị na kọleji ma eleghị anya bụrụ ebe anyị zutere nwunye ma ọ bụ di anyị. Ebe anyị nọrọ tozuo bụrụ ndị anyị bụ ugbu a. Ụlọ nye anyị bụ ebe ahụ n'eru anyị ala ka anyị na ndị anyị kacha hụ n'anya na-anọkọ. Ọ bụ ebe anyị nwere ike ịbụ onwe anyị ma ghara ichegbu onwe anyị maka ụwa dị n'èzí.

È kwuterè ya? Dị ka Webster dikshionari si kwuo, ụlọ anyị bụ ebe anyị bi, ọ bụ ebe anyị si, ebe anyị maara nke ọma. Mana dị ka 1 Pita 2:11 si kwuo, ụlọ anyị anọghị n’ụwa a:

"Ndị enyi m, ụwa a abụghị ebe obibi unu, ya mere, emela onwe unu obi ụtọ na ya. Unu achula ihe nke ụwa a iji tuo ndụ mmanụ wee tinye mkpụrụ obi unu na mgberede."

Ọ dịghị ihe dị njọ n'inwe aṅụrị n'ebe gasị mara mma nke ụwa a. Anyị n'enwe ọmarịcha ncheta na ahụmịhe-gasị n'ebe dị iche iche ka anyị n'ebi ndụ n'ụwa a. Mana anyị ekwesịghị ịtọ ute n'ala rapara n'ụwa a. Ụlọ anyị dị na ebe Jizọs anyị bi n'eluigwe. Ruo mgbe Ọ sịrị na oge eruola ka anyị na Ya nọrọ, anyị ga-anọ ebe a. Ma n'agbanyeghị ka anyị siri hụ ụlọ anyị gasị nke ụwa a n'anya, anyị apụghị inwe afọ ojuju zuru okè. Chee echiche banyere ihe onye na-ede abụ bụ Laura Story kwuru n'abụ ya ama ama, bụ Ngozi-Gasị:

"Gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụrụ na nnukwu nkụda mmụọ m ma ọ bụ ihe mgbu m gasị na ndụ a bụ mkpughe nke akpịrị ịkpọ nkụ ká ukwuu nke ụwa a n'enweghị ike imeju."

Naanị Kraịst pụrụ ime ka afọ ju anyị. Naanị ọnụnọ Ya na udo Ya nwere ike iwetara anyị ọn̄ụ dị ọcha, n'enweghị mgbagha. Naanị nkasi-obi Ya pụrụ iwepụ anyị n'ezie n'ime ndakpọ-olileanya na ọdachi. Otu ụbọchị anyị ga-alakwuru Ya n'ezie ebe O bi. A bụghị naanị maka Ekeresimesi mana ka anyị na Ya biri ebighị-ebi kwa ebighị-ebi.

Ụbọchị ahụ ga-abụ nnọọ ụbọchị ọnụ ọchị na obi ụtọ.

Ajụjụ:

Kedụ otu ị ga-esi kwe ka Kraịst mee ka afọ ju gị na mezuo mkpa gị niile n'oge Ekeresimesi a, kama ịdabere n'ihe ụwa a nwere ike inye?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 10Ụbọchị 12

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church