Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
Meri Ị Maarà
Meri, ị maarà na Nwa gị Nwoke ị mụrụ ọhụrụ ga otu ụbọchị jee ije n'elu mmiri?
Meri, ị maarà na Nwa gị Nwoke ị mụrụ ga-azọpụta ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị?
Ị mà na Nwa gị Nwoke ị mụrụ ọhụrụ bịara ime gị ka ị dị ọhụrụ?
Nwa a ị mụrụ ga-anapụta gị n'oge n'adịghị anya.
Ọ̀ dịtụla mgbe ị nụrụ egwú a bụ Meri, Ị̀ Maarà?
Akuolá egwú a n'emetụ ahụ na obi kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ n’oge Ekeresimesi. Edezirì egwú ahụ nke ọma ma ya enwee ụfọdụ akụkụ dị ike dị ka, "Meri ị maarà na nwa gị nwoke ga-eji aka Ya mee ka oké ifufe dị jụụ..." na "Nwa a ị mụrụ, ga-anapụta gị n'oge n'adịghị anya." Ọ bụ ajụjụ ndị na-akpali uchè nke onye dere egwú ahụ jụrụ bụ́ nke mere ka ndị n'ege ntị guzoro n’ijuanya maka ike nke Chineke anyị.
N’ezie, anyị amaghị ọtụtụ ihe banyere Meri ma e wezụga na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ma eleghị anya ọ ka dị afọ iri na ụma. Dị ka Luk 1:28 si kwuo, anyị maarà na ọ bụkwa onye enyere “amara nke ukwuu” nakwa na ‘Onye-nwe-anyị nọnyeere ya”. Ọbụna na-enweghị ihe pụtara ìhè ejiri mara ya, Chineke ji ya rụọ ọrụ. Meri nwa dị ụtọ n'edobe onwe ya, na abụghị nnukwu "onye ama-ama n'ime ihe" ka Onye Okike nke eluigwe na ala kpọrọ ka o soro gbanwee ụwa.
Ọtụtụ ndị n'eche na ihe mere Chineke ji họrọ Meri bụ n'ihi ịdị njikere ya. Mgbe ọ nụrụ atụmatụ Chineke maka ndụ ya, ọ zara si, “Abụ m ohu Onye-nwe-anyị. Ka ihe niile Ị kwuru gbasara m mezuo.” (Luk 1:38)
Meri kwuru naanị ee nye Onyenwe ya n'enweghị ihe ọ bụla ọ gbakwunyere.
Kedụ ebe ị nọ ugbu a na ndụ gị? Kedụ ihé ị bụ kà "mmadụ" ị nyefere n'ezie n'aka Chineke? Ị̀ na-ebi eziokwu ahụ bụ́ na "ndụ gị abụghị nke gị" nakwa na e ji "ihe kachasị ọnụ ahịa" wee goo gị? Ọ dị ihe n'efunahụ gị n'ihi na ị chọghị ikwe ka O duo gị?
Anyị nwere Mezaya. Aha Ya bụ Jizọs. Ọ bụ Ya bụ̀ Onye-Nzọpụta nke ụwa. O jere ije n'elu mmiri enweghị nsogbu ọbụla. Ọ bịara nwụọ ime ka anyị dị ọhụrụ. O ji unyí na asụ́ Ya mee ka otu nwoke kpuru ìsì hụ ụzọ. O si n'ụra dị ukwuu teta wee were aka Ya bụ nke mmadụ mee ka oké ifufe n'efe efe dajụọ. O ji achịcha obere na azụ̀ nye ihe karịrị puku mmadụ ise nri. Ọ na-eme ihe ebube.
O nwekwara atụmatụ dị ịtụnanya maka ndụ gị.
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ihe ị ka n'enyefebeghị n'aka Chineke?
Kedụ ihe n'egbochi gị ime otú ahụ?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church