Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ
Anụrụ M Kà Mgbịrịmgba N'akú N'ụbọchị Ekeresimesi
Mgbe ahụ mgbịrịmgba ndị ahụ kụrụ n'ụzọ dara oke ụda na ụzọ dị omimi:
“Chineke dị ndụ ka na-adị ndụ, Ọ dịghịkwa ehi ura;
Ihe ọjọọ na ndị ọjọọ ga-adà, ihe ziri ezi na ndị n'eme ihe ziri ezi ga-emeri;
Jirí udo nọgide n’ụwa, ihe diirí ụmụ mmadụ mma.”
Onye ka Chineke bụ nye gị? Ọ bụ onye-nchebe gị? Onye n'enye gị ihe? Oge Ekeresimesi a, ị kwela Ya ka Ọ bụrụ udo gị?
Ọ pụrụ ịdị mfe ile Chineke anya dị ka enyi ị ga n'agakwuru oge ọbụla i nwere nsogbu ma ọ bụ mmụọ anwansi nke ná-aza ekpere gị nile. Mana Chineke dị nnọọ ukwuu karịa nke ahụ, ngọzi gasị Ọ chọkwara inye gị adịghị agwụ agwụ! Ọ n'enye ọtụtụ ihe magburu onwe ya—ịna agaghị akwụ ụgwọ ma ọlị inata—gụnyere olileanya, ọṅụ, na udo maka obi gị. Chineke achọghị inye gị ihe ọbụla n'abụghị ihe kachasị mma maka gị.
Ọ bụ ezie na ọnọdụ gị nwere ike isi ike, ma ọ bụ sie ike ighọta mgbe ụfọdụ, nke ahụ apụtaghị na Chineke anọghị n'akụkụ gị. Ọ na-echè maka gị, jiri ịhụnanya zuru okè hụ gị n'anya, ma n'echere gị ka i kwe Ya ka Ọ bụrụ udo gị. Ya mere n'Ekeresimesi a, kà ị na-echè maka onyinye niile ịchọrọ ịzụ́, na ihe ndị niile ịchọrọ ime n'adịghị agwụ agwụ, echefula ịkwụsị ma cheta na ọ bụ naanị Chineke nwere ike inye gị ike dị jụụ n'adịghị agwụ agwụ nke sitere na udo Ya.
Ajụjụ Gasị:
N'ụzọ dị olee ka ị si enweta udo na nkasi-obi n'ebe Chineke nọ?
Kedụ ọnọdụ gasị siri ike ị n'eche ihu ugbu a ọ dị mkpa ka ịnata udo Chineke iji die ha?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church