Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Atụ

Carols: A Christmas Devotional

ỤBỌCHỊ 2 NKE 25

Ndị Mmụọ Ozi Ka Anyị Nụrụ Olu Ha N'elu

Ndị mmụọ ozi ka anyị nụrụ olu ha n'elu
N'agụ́ egwú n'atọ ụtọ n'elu ugwu gasị
Ma ugwu ndị ahụ ná nzaghachi
N'agụ egwú ọṅụ ha
Gloria na Excelsis Deo


Kedụ ihe n'eme ka ahụ maa gị jijiji n'ịtụnanya? Kedụ ihe ndị n'eme ka ị daa ogbi mgbe ị hụrụ ha? Ọ̀ bụ̀ ọhụhụ gị nke ị hụrụ onye ezinụlọ gị ị n'ahubeghị anya kemgbe ọtụtụ afọ? Ọ̀ bụ̀ ịga leta ebe dị oké ebube dịka nnukwu ugwu ịna anụ n'akụkọ dịka piramid ochie nke Ijipt? Abalị ahụ a mụrụ Kraịst bụ ihe mere eme kachasị dị ukwuu na dị oké ịtụnanya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, n'ihi na Chineke zitere Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya n’ụwa ka anyị wee nwee ndụ ebighị ebi ka e mesịrị ihe niile. Ọ dịbeghị ihe mere eme n’akụkọ nke ụmụ mmadụ n'ụwa tupu a mụọ Kraịst ma ọ bụ mgbe a mụsịrị Kraịst nke kpatara ka e nwee ememe dị otú ahụ nke na ndị mmụọ ozi n’onwe ha mere ka a mara ọnụnọ ha n’anụ ahụ́ na nụ olu ha n’abụ̀. Ị̀ pụrụ ichetụ n'echiche otú ọnụ ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ ga-esi ghere oghe ka ha hụrụ ndị Mmụọ ozi ahụ ma n'anụ olu ha? Oge ahụ dị ebube nke ukwuu nke na anyị nwere ike anyị apụghị ịghọta nke ọma otú ọ dị n'ihi na n'eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla n'ime anyị hutuberè ụdị ihe ahụ.

Ọ dị kà ndị mmadụ adịghịzi enwe ọtụtụ ahụmahụ n'eme ka ha tụọ egwu ma ọ bụ maa jijiji n'ịtụnanya. Teknọlọji ebutewo ọtụtụ ihe ụwa n'ime ụlọ anyị ma mee ka ha dị anyị oké nso nke na anyị nwere ike ịhụ ihe ọ bụla anyị chọrọ ịhụ ma nwee mmetụta nke ịnọ na ịga ebe ọbụla anyị chọrọ ịga. N'ụzọ dị mwute, ihe ka ọtụtụ n'ime anyị enwetubeghị ahụmahụ nke ihe ịtụnanya dị egwù na mmekọrịta anyị na Chineke, dị ka anyị kwesịrị. Mmekọrịta anyị na Ya na aghọ ihe dị oké nrọ̀ ma ọ bụ dị nkịtị. N'ekeresimesi a, gbalịa hụ na iweghachitarà oge ndị ahụ na-akpali oké ịtụnanya n'etiti gị na Chineke. Gbalịsie ike mee ka mmekọrịta gị na Ya bụrụ nke n'atọ ụtọ na dị oké ịtụnanya nke na ịga amalite ṅụrịwa ọṅụ dị ka ndị mmụọ ozi ahụ mere. Ekwela ka mmekọrịta gị na Ya bụrụ nke nkịtị, kama mee ka ọ bụrụ ihe pụrụ iche.

Ajụjụ Gasị:

Chee echiche banyere oge ụfọdụ na-akpali ịtụnanya dị egwù nke gị na Chineke nweworo. Kedụ ka oge ndị ahụ siworo gbanwee gị?

Kedụ mgbanwe gasị ọ dị mkpa ka ị mee na ndụ gị ka i malite inwekwu oge ndị dị ịtụnanya na dị egwù n'ebe Chineke nọ?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Carols: A Christmas Devotional

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church