Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na OtuIhe Atụ

21 Day Fast

ỤBỌCHỊ 12 NKE 21

Nri bụ ihe nkasi-obi nye ọtụtụ ndị mmadu. Tụgharịa uche na ka mkpụrụ-echiche gị si dakwasị nnọọ na ụfọdụ nri, otù ihe ndị i n'ebu ọnụ maka ha si agụsi gị agụụ ike, ikekwe ya aburu ụdị ahu ịga ata n'ọnụ a i n'ebu.
Echiche ndị a, ha bi ebi n'ime obi gị?
Ọ bụrụ mmanya oku ma ọbụ ogwu n'egbu egbu, ịga ewere onwe gị dika onye ụdị ihe ndị n'eri ahụ n'ihi na mmụọ gị nwere mmasị-ike banyere ha?
Nye otutu ndị mmadu, ibu ọnụ a nwere ike imalite mkpughe anya ha banyere ka nri si were ọnọdụ n'adighi mma na ndụ ha.
O nwere ike ikpughe ihe iri ahụ dịnụ.
Kpee ekpere ka Chineke nke obi-ebere na nkasi-obi niile bụrụ ebe mgbaba mbụ nke ngugu gị.
Rio Ya ka O were ahụmịhe ntaramahụhụ nke ibu ọnụ a wepụ ihe ọbụla nọ na ndụ gị nọchiri ọnọdụ Mmuo Nsọ dika Onye-Nkasi-Obi gị.
Ụbọchị 11Ụbọchị 13

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

21 Day Fast

Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.

More

We'd like to thank Life.Church for their generosity in providing the structure for the 21 Day Fast reading plan.