Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Ọ bụ eziokwu na-enweghị atụ: Chineke debere gị ebe a kpọmkwem, n'oge a a n'akọ ihe mere eme, maka atụmatụ na ebumnuche Ya. Ọ chọrọ onye dị ka gị nke ga-ahụ ndị a na-ekwesịghị ihụ anya n'anya - iji weta oñu n'ụwa gbara ọchịchịrị, nke juru oyi - iji kpughee udo n'ime mkparịta ụka na n'ọnọdụ ndị na-agbagwoju anya - na inwe obiọma n'oge mgbe omenala anyị di obi ọjọọ. Chineke, Onye Okike nke Eluigwe na Ala, chọrọ onye dị ka gị ga na-enwe nchekwube mgbe niile n'agbanyeghị ọnọdụ ndị na-akụda mmụọ - ga na-enwe olileanya mgbe a na-enweghị ihe kpatara olile anya - ga na-enwe ndidi n'ebe ndị n'eme isi ike na ndị ahụ ntakasi nọ. N’ihi na ị di Chineke mkpa, Ọ kere gị ka i kpughe obi Ya. Nsogbu bụ, dị ka ụmụ Ya onwe Ya, anyị enwetawo ọtụtụ ihe e ji mara mkpụrụ ndụ ihe nketa nke ụwa ma hapụ àgwà ọma Chineke, nke Nna anyị nke hụrụ anyị n’anya nyere. Nsogbu bụ, ọ ga-akara anyị mma ịme ihe n'ụzọ anyị karịa ịme ihe n'ụzọ Ya. Nsogbu bụ na anyị na-ahọrọ ilekwasị anya na ịchọ maka ọdịmma naani onwe onye n'ọnọdụ anyị na-agabiga karịa igosipụta mkpụrụ na-enye obi ụtọ ma na-atọ ụtọ.
Chineke kere anyị ka anyị kpughee obi Ya n'oge a kpọmkwem n'oge niile edere ede. E kere anyị ka anyị na-arụ ezi ọrụ Ya ma kama, anyị ekpebiela igho mmetụta uche n'ezighi ezi nke Ọ zubeere anyị ka anyị bụrụ. Chineke kere anyi n'ihi na enweghi "odidi Chineke" n'uwa, ya mere Ọ jiri zite gị na zite m. Chineke naani ga-ekpughe onwe Ya site n'aka anyị ruo n'ókè anyị kwere ka Ọ mejupụta akụkụ niile nke obi na ndụ anyị. Eziokwu nke magburu onwe ya na nke na-ama obi jijiji bụ na ị nwere ike inwejụ Chineke n'uba otu ọbula ị si chọọ Ya! Ajụjụ a agbanwebeghị site n’ogige Iden ruo taa, ole n'ole n’ime Ya ka ị chọrọ?
Igodo: ụbọchị_otu
ụbọchị_otu?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com