Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

ỤBỌCHỊ 4 NKE 30

N'ezie enweghị m azịza anwansi ọ bụla maka mmetụta uche gị n'enweghi njikwa, mana enwere m nghọta ụfọdụ n'ime Okwu Chineke maka gị. Ọ bụrụ na ị na-achọ ike imeri ma ọ bụrụ na ọ na-agụsi gị agụụ ike ịbụ onye Chineke kere gị ka ị bụrụ, mgbe ahụ ị ga-ebu ụzọ rịọ Ya maka ike Ya. Mgbe ị rịọchara maka ike Ya, ị ga-echere maka ike ahu. Mgbe ị na-eche maka ike ahu, ị ga-anọgide na-etinye onwe gị n'ekpere.

Ekpere na-agbanwe m. A na m abu ezigbo mmadu mgbe m na-ekpe ekpere. Ezinụlọ m na-ahu m n'anya karịa n'oge m na-ekpe ekpere ka m n'eche. Mgbe m na-ekpe ekpere, a na m eme mkpebi ndị amamihe dị na ha, na-abụkwa ụdị onwe m dị nma, dị obi ebere. Ikekwe ihe kpatara na onwe gị anaghị amasị gị n'oge iwe mmetụta uche gị bụ n'ihi na ị nwetabeghị ike ma ọ bụ ọnọdụ nke nchere. Ndị kasị ike m maara bụ ndị ikom na ndị inyom nke Chineke na-enwe mmasị ichere n'ikpere ha. Ịgbụ ikpere n'ala abụghị ihe a na-amaghi, ọnọdụ siri ike nye ndị a na-agbanwe akụkọ ihe mere eme n'ihi na ha ghọtara na ndị na-ekpe ekpere n'ezie bụ ndị na-erite uru nke ike eluigwe na ndụ ha kwa ụbọchị.

Enwekatala lelịa mkpa oge ị na-etinye kwa ụbọchị na ikpere gị dị, bụ́ nke ga-enyere gị aka imeri mmetụta uche gị na-enweghị njikwa. Mmetụta uche na-enu enu, dị ntorobịa na mgbe ụfọdụ di ike ịmebi ihe ma otu n'ime ike kachasị ike n'ịchịkwa mmetụta uche mmadụ bụ oge ikpere. Ọgwụgwọ nke na-ewere ọnọdụ n'ime mkpụrụ obi mmadụ mgbe anụ ahụ nọ n'ọnọdụ ekpere dị ebighi ebi na ọrụ ebube. Enweghị m ike ịdị ka Jizọs ma ọ bụrụ na etinyeghị m oge n'ihu Ya n'ikpere m.

E nwere m ike "ime ihe" dị ka Jizọs na-ejighị nkwado ike nke ekpere. Enwere m ike inwete akara ugo nke Academy Award maka ịmụmụ ọnụ ọchị nke ukwuu na ikwụputa okwu ọma mana obi m a na-enwusi ike n'iwe ma uche m ejupụta na-ibọ ubọ. Ọ bụ ezie na a maara m otú e si ekwu okwu ndị kwesịrị ekwesị, ma ọ kaaara gị nma na ị hụrụ anwụrụ ọkụ si na ntị m mụ kpọpuru ebe ibe abụọ apụta! Jizọs achọghị naanị ka m mee ihe dị ka Ya, mana ọ na-agụsi Ya agụụ ike ka m dị ka Ya, e nwere nnukwu ọdịiche di na etiti ha abụọ. Ihe dị iche na-ewere ọnọdụ mgbe m na-echere na mgbe m na-ekpe ekpere n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka Ọ na-aghọ Eze nke mmetụta uche m na nke ndụ echiche m.

Igodo: ụbọchị_anọ
ụbọchị_anọ.
Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: www.justjoyministries.com