Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Esta bụ nwa na enweghị nne na nna, bụ́ onye Mọdekaị nwanne nna ya n'alughi nwaanyị, zụlitere. Mgbe Eze Ahasuirọs kpebiri na ya chọrọ ịlụ nwaanyị ọhụrụ, ndị nlekọta ya mere asọmpi maka umu nwaanyị mara nma nke kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme niile.
Esta meriri n'asọmpi ịma mma ahụ wee nweta ihu ọma n'aka ndị niile nọ n'ime mgbidi ụlọ eze ahụ.
Mgbe nwanne nna ya bụ Mọdekaị jụrụ ịkpọ isiala nye Heman, bụ́ otu n’ime ndị isi ndụmọdụ eze, e kpebiri na ọ bụghị nanị na a ga-egbu Mọdekaị, kama Heman nwetara ikike n’aka eze na a ga-egbu ndị Juu niile. Mgbe Mọdekai matara bayere ajọ ìzù a, ọ dọkara uwe-ya niile ọ yi n'ahu ya, yikwasi onwe ya ákwà-nkpe na ntu, puo banye n'etiti obodo ahu, wee n'eti mkpu nke-ukwuu na n'oké ilu.
Ụzọ nzaghachi Mọdekaị maka ọnọdụ jọgburu onwe ya, ọ dị nwute, nwere ike ibu otu i si azaghachi ihe ndi n'eme n'ndụ gị. Mgbe ihe n'adighị aga n'ndu gị otu ị si chọọ, ị na-eso omume Mọdekaị, ị na-eyikwasi onwe gị ákwà-nkpe na ntu wee na-atanwụ ma n'eme mkpesa jiri olu ike na obi ọkụ nke mere na obodo niile ana anụ olu gị!
Ọ bụrụ na ị họro iji àgwà nke ọdịmma onwe onye nanị na nke nwantakịrị ije ije ná ndụ ma yiri ákwà nke iru uju na ntụ, ị ga-agọnarị onwe gị uto mmekorita gị na Eze nke ndị eze niile kwesịrị inwe! Ọ dighị ihe mebirinụ ... ị ka bụ Onye Nke Kraịst na ị ka ga-eso Jizọs nọrọ n'Eluigwe mgbe ebighị ebi, òtù ọ dị, itinye uche gị n'ihe mgbu gị ga-agọnahụ gị ụtọ nke mmekọrịta ịhụnanya nke gị na Ya mgbe ị nọ n'ụwa.
Anyị kwenyere n'ụzọ n'abụghị eziokwu na ọ bụrụ na anyị etie mkpu n'ihe mgbu anyi nke ukwuu, anyị ga-anatanwu igere ntị nke Chineke. N'ụzọ megidere nke ahụ, ezi okwuntughe nke ọnụnọ Ya bụ ekele!
Mgbe Esta bụ́ eze nwaanyị, nụrụ banyere ákwá ariri Mọdekaị na-ebe n’ihu ọnụ ụzọ ámá eze, ọ zigaara Mọdekaị uwe ọhụrụ, ma Mọdekaị ekweghị iyi ha. Mmụọ nsọ enyewokwa anyị uwe ọhụrụ ka anyị yinye n'ahu, ma ọtụtụ mgbe, anyị na-ajụ ịnakwere uwe otuto Ọ nyere anyi kama na-ahọrọ ịzọ ndụ n'uwe nke mgbu na mgbawa obi. Eze nke ndị eze niile maara na ọnụnọ Ya bụ ebe ị ga-enwe mmeri maka gị na emeghewo ọnụ ụzọ saa mbara ka ị banye. N'ụzọ dị mwute, ị gaghị enwe ike ịbanye n'ime ogige dị n'ime nke Obí Ya mgbe ị ka-yi uwe nke ndakpọ olileanya nke ọnọdụ gị.
Yiri uwe nke otuto! Kama ina ewe iwe na mgbu mmetụta uche ... chilie aka gị abụọ elu ma bụrụ abụ bubata onwe gị n'ihu Ya!
Igodo: ubọchị_itolu
ubọchị_itolu!

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com