Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Chineke mere ka ị na-abawanye na ka ị na-etowanye. Ọ mere gị n'ụzọ ime mmụọ maka ịba ụba nke mmetụta uche na nke mmụọ n'oge ọ bụla nke ndụ gị. Atụmatụ Ya abụghị na ị ga-adi ka ákwá apịkọrọ apịkọ n'mmetụta uche gị, ma ọ bụ na iwe na ịda mbà n'obi na nchegbu ga na-azọda gị n'ala. Chineke maara na anyị nile ga-enweta ahụmahụ ajọ ifufe na mmetọ nke omenala anyị, mana ọgụgụ isi ihe okike Ya nyere ụzọ iji nọrọ na Osisi Vaịn n'oge mgbanwe niile nke ndụ n'enweghị usoro. Uche Chineke maka gị bụ ka i na-eme nke ọma n'akụkụ ọ bụla nke ndụ gị, nke ahụ gụnyekwara n'ime mmetụta uche gị!
Okwu a bụ “ibawanye” bụ okwu Hibru nke bara ụba n’ihe ọ pụtara na n’ihe eji ya eme. Ọ na-ezo aka mgbe niile na ihe ma ọ bụ onye na-eto eto site na mwụli na mmali ahụ ama ama. "Ibawanye" bụ okwu ihe onyinyo nke osisi a kara aka itolite nke ukwuu n'agbanyeghị ọnọdụ ihu igwe ma ọ bụ ụkọ mmiri ozuzo.
Onye ọbụ abụ na-ekwupụta na “onye ezi omume ga-abawanye dị ka osisi nkwụ.” Ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ ejiri okwu ahụ bụ́ “onye ezi omume” kọwaa mmadụ, ọ pụtara na onye ahu kpachaara anya họrọ ijikọta onwe ya na Chineke. Ị ga-abawanye, yabụ, n'ụzọ njikọ gị na Chineke siri di! Ọ bụrụ na ị họrọla ino n’ihu Ya kwa ụbọchị ma wepụta oge igu Okwu ya na ikpe ekpere, ndụ gị ga-abụ nnukwu ngosipụta nke uto nke na-abịa site na njikọ gị na ezi omume Ya.
Ọtụtụ Ndị Kraịst nwere njikọ chiri anya na ihe mgbu nke ndụ ha gara aga karịa ka ha nwere n'eziokwu nke ọnụnọ Chineke kwa ụbọchị. Ọ baara gị uru n'ụzọ mmetụta uche ma ị̀ na-agụ Akwụkwọ Nsọ gị kwa ụbọchị ị chọrọ ma ọ bụ na ị chọghị. Ọ baara gị uru n'ụzọ mmetụta uche ma ị̀ na-efe ofufe ma ọ bụ na ị naghị efe ofufe n'agbanyeghị mmechuihu gị. Ọ baara gị uru n'ụzọ mmetụta uche ma ọ bụrụ na ị na-ekpe ekpere maka ndị mejọrọ gị. Ọ bara uru n'ezie.
Mgbe ị na-ahọrọ nke ọma, Chineke ga-eme ka uto malite! Ị ga-amalite itolite site n'mwụli na mmali elu n'ụzọ ime mmụọ na nke mmetụta uche n'ihi na ị na-enweta ndụ site na Chineke. Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ ga-eme gị n'ụzọ ọrụ ebube ka ị bụrụ onye nwere mkparama àgwà na ọdịdị nke Chineke.
Gị na Chineke ga na-arụkọ ọrụ ruo mgbe nzaghachi mmetụta uche gị nye ihe ndi n'eme ebe ino bụ ihe mpụta nke miri emi na nke bara ọgaranya njikọ gị na Ya.
Igodo: ubọchị_Iri na abụọ
ubọchị_iri na abụọ.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com