Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
N'agbanyeghị ọgụ mmetụta uche ị na-agabiga ma na-alụ taa, mgbe ị banyere n'amamihe nke Okwu Chineke na ike nke Mmụọ Nsọ, ị na-enwe nkwa siri ike na ị ga-emeri ọgụ ọ bụla ị ga-ezute. Ị bụghịzi onye obi ọjọọ na onye iwe iwe n'obi n'enye nsogbu, kama ị bụ onye mmeri n'ihi oké ịhụnanya nke Kraịst nwere n'ebe ị nọ.
N'ezie Chineke nwere atụmatụ maka ndụ gị kwa ụbọchị, atụmatụ Ya bụ nke ọñụ, udo na mmeri. Chineke na-achọsi ike ka gị merie nsogbu mmetụta uche gị n'ihi na ị so dị oké mkpa maka atụmatụ Ya nke dị ukwuu n'oge akụkọ ihe mere eme nke ugbu a. Ọ bụrụ na ị na-aga n'ihu n'enwe obi ilu, n'iwe na ịda mbà n'obi, ụwa ga-efunahụ onyinye ahụ e kere gị ka ị bụru. E nwekatakwala chee na Ị bụ naanị otu ọnụ ọgụgụ n'abaghi uru nye Chineke, na ị ga-agbanari site n'ifekasi mmechuihu gị na ujo gị n'ụzọ na-enweghị ezi oke. Ị bụghi naani otu n'ime oha mmadu, ị bụ akụ bara uru nke nwere ike iweta mgbanwe dị ukwuu n'oge akụkọ ihe mere eme a na-akọ ugbu a.
Ị ga-ebu n'obi ịbụ onwe gị nke kachasị mma? Ka ị ga-abụ onyinyo nke mmadụ gbagọrọ agbagọ nke n'esi n'ụzọ mmetụta uche pụọ na atụmatụ Chineke maka ndụ ya? I dị Chineke oke mkpa! Ọ chọrọ ka ị bụrụ ihe ngosi dị ndụ nke obi ụtọ na udo mgbe ihe niile di n'uwa gị na-ada n'ekewasi. Ọ chọrọ ka ị bụrụ ọmarịcha ngosiputa oru aka Ya nke ezi omume na ndidi n'ime odibendi n'enweghi njikwa. Chineke chọrọ ndị ikom na ndị inyom n'ọgbọ ọ bụla ga-ekwupụta, "Ndụ m abụghị banyere m na mmetụta m. Ndụ m bụ maka ijere Chineke ozi na ikpughe àgwà Ya nye ụwa m!"
A ga-echeta gị maka abụ nke obi gị ma ọ bụ maka nti mkpu gị banyere adighị nma nke ndụ gị? Anyị niile ga-ahapụ ihe ncheta nke nhọrọ mmetụta uche anyị na-ekpebi kwa ụbọchị. Ihe ncheta nke mmetụta uche na nke mmụọ nke ị na-ahọrọ inye ọgbọ ndị na-esote gị dị mkpa karịa ego, ụlọ ma ọ bụ ala ị na-ahapụ. Ka ị na-ele anya n'nkwakosi mmetụta uche nke omenala gị, ihe nketa ezinụlọ gị na ọnọdụ gị na-enye maka isi nke ndụ gị, e nwekatakwala chefuo na Chineke na-enye ihe Ya kacha mma ndị na-ahapụrụ Ya nhọrọ ka Ọ mee!
ụbọchị_nke iri atọ!

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com