Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
![Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F255%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Obi gbawara agbawa dị ukwuu karịa ndakpọ olileanya ma na-efebata n'ndụ anyị jiri ike nke na-ahapụ ihe niile n'ọnọdụ gbanwere agbanwe ruo mgbe ebighị ebi. Obi etiwara etiwa ga-eme ka ị na-agbo ogbugbo n'ihe mgbu ma na-asu udè n'iru uju. Obi gbawara agbawa ga-eme gị ka ọ di ka ị gaghi ekunwu ume.
Chineke maara na mgbe anyị na-ebi n'akụkụ nke a nke elu-igwe na a ga-enwe ndị mmadụ, ihe ndị n'eme na ihe ndụ ga-etiwa obi nke ụmụ Ya Ọ hụrụ n'anya ya mere Ọ jiri nwee atumatu maka oge kacha di njọ na ndụ gị.
Okwu a bụ "gbajiri agbaji" n'asụsụ Hibru bụ okwu shabar ma ọ pụtara "ịdọbi n'ike, ịmebi ma ọ bụ ịgwepịa; ịmeru ahụ, ịmenye ọrụ n'ahu, ịgbarịsị ma ọ bụ ịgbaji." Okwu Hibru oge ochie bụ asụsụ na-akọwa ihe nke ọma ya mere okwu a bụ shabar na-abịa a bụghị nanị jiri nkọwa, kamakwa ọnọdụ ndị e jiri mee ihe na nkọwa ya. E ji okwu a kọwaa ụgbọ mmiri ndị tipịasịrị etipịasị ma a dọpụsịrị ha site n’ihu ruo n’azụ n’ihi oké ifufe na oké mmiri. E jikwa ya kọwaa ihe ndọkasị na ndọpusị nke anụ ọhịa ndị ahụ na-eri anụ, na-eme n’ahụ ndị ha jidere. Enwere ike ịsụgharị ya n'ụzọ nkịtị di ka "ndị asụpụsiri obi ha."
Okwu bụ maka “obi” n'ime Akwụkwọ Nsọ a na-ekwu maka ya bụ mkpụrụ okwu leb ma ọ na-ezo aka maka mkpụrụ obi ma ọ bụ obi nke mmadụ. Ọ na-agụnye àgwà di nma ma ọ bụ nke di njọ nke mmadu, agụụ iri ihe ma ọ bụ ime ihe, mmetụta uche, agụụ ọchịchọ ma ọ bụ mmasị na ọbụna uche na ebe ndokwa echiche.
Mgbe onye Abụ Ọma na-ekwupụta na “Onye-nwe-anyị nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa,” okwu ya bụ okwu e ji nlezianya na-nkpachapụ anya na nnukwu ọmịiko kwuo. Ọ na-echetara Ndị Kraist niile gburugburu n’oge ndị na-abịa n’ihu na Onye-nwe-anyị na-eji ịhụnanya di egwu ege ndị na-agabiga ihe mgbu a na-apụghị ichetụ maka ya nti. Ọ nwere ike ịbụ na nnukwu ajọ ifufe bụ ihe kpatara ihe mgbu a na ndụ gị ma ọ bụ onye ọjọọ na-akpa àgwà ka anụ ohịa butere ya, mana Onye-nwe-anyị guzo n'akụkụ gị di njikere na n'elezi anya nke ọma banyere obi gị etiwara etiwa na agba-ọbara.
Ọ bụrụ na ị nwetụla ahụhụ site na ọnọdụ mmekpa ahụ a, achọrọ m ime ka obi sie gị ike na ọ dịbeghị mgbe ị nọghị na-nlekọta nke Chineke. Ọ bụrụ na, taa, obi gị bụ nke etiwara etiwa ma gị a na-eche ka ị ga-esi die mmekpa ahụ ọzọ taa, achọrọ m ịkasi gị obi na Ọ nọnyeere gị ugbu a.
Igodo: ụbọchị_iri abụọ na isii
ụbọchị_iri abụọ na isii.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F255%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com