Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

ỤBỌCHỊ 27 NKE 30

E nwere okwu a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu na ọbụna Ndị Kraịst na-enweta nkasi obi site na ya n'oge mkpagide na ọdachi, "Oge na-agwọ ọnyá niile."

Ka m gwa gị n'olu dara ụda - EKWETEGHỊ M!! Oge enweghị ike ịgwọ ọrịa n'onwe ya. Naanị Chineke nwere ike ịgwọ ọrịa! A maara m ụmụ nwanyị ndị ka bu ilu n'obi na iwe ka na-ewe taa di ka ọ dị ha n'afọ iri gara aga. Oge agwọbeghị ọnyá mkpụrụ obi ha. A ma m ụmụ nwanyị ndị ka na-ata ndị mejoro ha ụta n'olu ike ụbọchị taa dị ka ha na-ata ha ụta afọ 30 gara aga. Oge agwọbeghị ụmụ nwanyị ndị a ike gwụrụ, bụ ndị olu gụrụ.

Naanị Jizọs nwere ike ịgwọ ọrịa, ya mere ọ bụrụ na ị nwere obi mgbawa na agụụ nkasi obi, mgbe ahụ ị ga-abanyerịrị n'ihu Ya ebe ọrụ ebube na-eme na a bụghị maka oge, kama n'ihi Ya. Ị na-ekwe ka nso na-akasi obi Ọ na-enye ndị obi ha tiwara etiwa gwọọ ọnyá obi gị taa?

Ọ dịghị onye pụrụ imezi obi tiwara etiwa ma e wezụga Onye-nwe-anyị. Okwu ndị ọzọ ga-agba gị ume ma weta ufodu ọgwụgwọ mana ọgwụgwọ nke kasịnụ na-esi n’aka Onye-nwe-anyị mgbe niile. Omume ọma na akparamàgwà ọma nwere ike wepụ ufu sitere n'obi etiwara etiwa, ma ọ dịghị ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọzọ na abughị Onye-nwe-anyị nwere ike ịkpunye okpu-eze nke ọgwụgwọ na ndụ gị. Ọ nwere ike, ihụnanya na nka dị nsọ iji gwọọ gị n'ezie n'ahụhụ n'enweghị atu ị na-agabiga.

Chineke pụrụ iweghachita mkpụrụ obi gị ma mee ntụgharị obi nke mmụọ ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe ọ ga-ewe iji mee ka ị nweta ahụike na olileanya ọzọ. Nke a dị ka ihe na-agaghị ekwe omume mgbe ị nwere obi mgbawa ma ọ bụghị ihe na-agaghị ekwe omume n'ebe Chineke nọ! Ebum n'obi nke Chineke bụ mweghachi na ọgwụgwọ mgbe niile.

Anyị nwere ike ịghọta n'ụzọ dị mfe udi echiche Mmụọ Nsọ na-agbalị ikwuputa site na onye ọbụ abụ n'okwu a, " - na-ekechikwa ọnyá ha." Okwu ihe atụ a na-ekiri n’asụsụ Hibru bụ ọmarịcha ihe atụ nke onye na-akwa ákwà ji nwayọọ na-edozi ma na-adụkọta ihe ndị ahụ dọwara adọwa. Ọ bụrụ na ị nwere obi etiwara etiwa, enyi, A maara m Onye nwere nka ọkachamara ga-edozi ya n'uzọ di mfe na nke zuru oke. Ọ bụghị naanị na Ọ nwere ike imezi obi gị etiwara etiwa, ma Ọ nwere mmasị ime ya.

Igodo: ụbọchị_iri abụọ na asaa
ụbọchị_iri abụọ na asaa.
Ụbọchị 26Ụbọchị 28

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: www.justjoyministries.com