Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

ỤBỌCHỊ 28 NKE 30

Chineke akwụsịbeghị ịbụ Chukwu n’ihi na ị nọ na ndagwurugwu. Ọ kwụsịbeghị ịbụ Chineke nke ịdị mma na obiọma n'ihi na i nwere ndakpọ olileanya ma ọ bụ na i nwere obi mgbawa.

Ọ ga-amasị anyị niile ibi ndụ anyị n'elu ugwu. Ọ ga-amasị anyị niile ikuru n'ume ikuku ugwu ahụ di ọhụrụ ma hụ ọmarịcha ihe ndị a pụrụ ikiri ekiri. Ị pụrụ ịhụ ihe ndị dị n’elu ugwu ị na-enweghị ike ihụ na ndagwurugwu. Ihe niile na-ewere ọnọdụ ziri ezi mgbe ị nọ n'elu ugwu. Ị nọ n'elu ụwa n'ezie. Ọ bụ ebe kwesịrị ekwesi maka eze nwanyị - eze nwanyị nke ugwu!

Ọ dịghị onye n'ime anyị chọrọ ịzụta ala ma oli na ndagwurugwu nke obi nkoropụ na ndakpọ olileanya. Ị pụghị ihụ ụzọ otu kwesiri ekwesi n'ebe ahụ dị ala ma ị nweghị ike ịhụ ihe ọbula ma ị lefee ụmụ osisi na-esote anya.

Mana ọ bụ na ndagwurugwu ka ahịhịa na-eto burukwa ebe akwụkwọ osisi mara nma na-aba ụba. Ọ dịghị ihe na-eto n'elu ugwu naanị ihe ị ga-ahụ ebe ahụ bụ nkume na nnukwu nkume. N'elu ugwu abụghị ebe a ga-agbanye mgbọrọgwụ - nke ahụ bụ nke na-eme na ndagwurugwu dị n'okpuru. Ọ bụ na ndagwurugwu ka uto kacha mma nke ndụ gị ga-eme nakwa ọ bụ ebe ahụ ka mkpụrụ nke mmụọ nsọ ga-eto n'ụba. Ka m kwuo ya otu a: N'ime ndagwurugwu ebe ahụ etiwara obi-gị ga-abú ebe ị ga-erite uru gị kachasi.

Chineke chọrọ ka iko anyị na-ejupụta ejupụta a bụghị naanị mgbe ndụ dị mma na ihe ndị anyị na-ahụ magburu onwe ya; Ọ chọrọ ka iko anyị na--ejupụta ejupụta na ndagwurugwu nke ihe mgbu na n'ime ọzara nke obi ntiwa. Chineke na-edobe tebụl ngọzi n'ihu gị nke ga-agwọ obi gị etiwara etiwa ma nye mkpụrụ obi gị nri nke agụụ na-agụ.

Chineke chọrọ ka ị bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị maara na ndakpọ olileanya enweghị ike iwepụ gị n'ihe Chineke kwadoro banyere gị. Chineke chọrọ ka ị bụrụ onye na-aribata n'ihu Ya n'oge obi mgbawa na obi nkoropụ. Chineke chọrọ ka ị bụrụ Onye Kraịst nke na-adịghị ata ụta kama bụrụ nke na-agọzi mgbe niile. Chineke chọrọ ka ị bụrụ onye kwere ekwe nke na-amị mkpụrụ di nma n'oge kacha njọ nke ndụ.

Igodo: ụbọchị_iri abụọ na asato
ụbọchị_iri abụọ na asato.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 27Ụbọchị 29

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: www.justjoyministries.com