Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Abalị ọ bụla mgbe elekere ruru etiti abalị, ị naghị aghọ ugu mana ị bụ onye na-enweta onyinye ọhụrụ, na-enwu gbaa. Anyị niile na-enweta otu onyinye a n'agbanyeghị otu anyị si buo ibu ma ọ bụ taa ahụ, afọ ole anyị dị, agụmakwụkwọ, ịma mma, ọrụ anyị na arụ ma ọ bụ ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị. Mgbe ụbọchị ọhụrụ ọ bụla welitere isi n'ụra ya, ọ bụ naanị gị nwere 1440 n'ime ngwa ahịa kachasị ike nke dị ahukebe n'akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. N'otu nkeji ka etiti abalị gachara, ụbọchị niile nke ndụ gị, eluigwe na-emepe onu ụzọ ya ma nye gị nkeji 1440 a na-emetụghị aka na nke bara uru iji mee ihe ọbula ị chọrọ. Otu ị si eji nkeji gị eme ihe bụ naanị gị ka ọ gbasara! Oge bụ ihe a na ejighi ego azụ, mana ọ nweghị onu ahịa a ga-eji tunyere ya!
Ị nwere ike gị a na-agba asịrị ma ọ bụ gị a na-efe ofufe - ị nwere ike ijupụta na iwe ma ọ bụ na ekele - ị nwere ike ịgba ọsọ kilomita ise ma ọ bụ na-ekiri telivishọn ogologo ụbọchị dum - ị nwere ike ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ gaa na nnukwu ụlọ ahịa. Gị onwe gị, na naanị gị, ga-ahọrọ otu ị ga-esi jiri onyinye a dị oke ọnụ ahịa na-erite uru. Ị nwere ike ịhọrọ ịchị ọchị ma ọ bụ ịkwa ákwá - ịme ntanwụ ma ọ bụ ịñụrị ọñụ - i bụ onye obi ilu ma ọ bụ ị bụ onye na-ahọrọ ihu ihe ọma n'ndụ ya - i bụ onye obi na-ajo njọ ma ọ bụ ị di nma karịa ka ị di n'mbu. Oge 1440 ndị a bụ nke gị, ọ nweghị onye ọzọ nwe ha ma ọ bụghị gị! Ha abụghị nke di gị ma ọ bụ nke onye isi ulọ ọrụ gị ma ọ bụ nke ụmụ gị iji mee ihe.
Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe ndị anyị ga-eme. Ọtụtụ n'ime anyị ga-arụ ọrụ mana anyị na-ahọrọ ka anyị si arụ yabụ ọrụ. Anyị nwere ike iga ụlọ ọrụ anyị buru ihu gbarụrụ agbarụ ma n'aga ije ka a ga-asi na nsogbu anyị kachasị nke onye ọbụla, jupụta n'iwe na ịkwu okwu ọjọọ ma ọ bụ anyị nwere ike zọbata ije jiri obi ụtọ, na-arusi ọrụ ike na otu ọ kwesịrị na na-ekpere ndị nọ n'ulọ ọrụ anyị ekpere. Ị nwere ike ịkpọ nkeji ọ bụla ị na-arụ ọrụ asi ma na-egbu oge site na gị na ụmụ agbọghọ nọ n'ulọ ọrụ ịgba asịrị, gị na-egwu egwuregwu na kọmputa na ezopụ n'ọnụ ụzọ nkeji ise tupu oge iji arụ ọrụ ezuo. Ma ọ bụ ị ga-amata na Chineke dobere gị n’ọkwa a ka ị bụrụ ngọzi na na-eweta ọmarịcha na àgwà nke Chineke n’ebe ulọ ọrụ gị.
Ọ bụ eziokwu, ị ghaghị ilekọta ndị nne na nna meworo agadi, zụọ ụmụ gị ma wepụ ihe mkpofu ahụ n'esi ezigbote isi. Ka ọ sina dị, ị na-ahọrọ ka ị ga-esi eme ihe ndị ị kwesịrị ime. Ị nwere ike iji nzọụkwụ dị arọ na obi nkụda mmụọ mee njem na ndụ ma ọ bụ ị nwere ike iji ndidi, ịhụnanya na ọñụ rụọ ihe niile dị mkpa na ndụ.
Igodo: ụbọchị_iri abụọ na abụọ
ụbọchị_iri abụọ na abụọ.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com