Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

ỤBỌCHỊ 21 NKE 30

Gịnị kpọmkwem bụ ike ọgwụgwu n'ime ahụ n'obi? Enweghị ike ịkọwa isi ọwụwa nke mkpụrụ obi a dị ka "ịda mbà n'obi" n'ihi na ị ka nwere ike n'eme ihe ndị ikwesiri ime ma ọ bụrụ na ị nwere udi nsogbu a. Ị ka na-ahọrọ, n'agbanyeghị enweghị ike gị, izopu otu ụkwụ n'ihu nke ọzọ. Ị ka nwere ike iso ndị mmadụ na-ekwukọrịta okwu, n'agbanyeghị na azịza gị enwechaghị ụtọ dị na ya ma ọ bụ ndụ. Ị kabeghị gbaba n'ọgba n'agbanyeghị na ị na-ata ahụhụ n'okpuru ákwà mkpuchi n'eme ka ezigbo ahiri supụta gị n'ahụ, ụra di nnọọ ogologo na enweghị mkpotu ọbụla a na-adọ gi akpiri. Kwa ụbọchị. Ụbọchị niile.

Ị nwere ike ibili kwa ụtụtụ, n'agbanyeghị na ị na-arụ ọrụ naanị na ọkara nke ikike gị. Ị dịghị ida mbà n'obi, ma ị naghị enwekwa ọñụ ma ọ bụ nwee obi ụtọ maka ihe ọ bụla. Ụbọchị kwa ụbọchị na-abịa na-ala n'enweghi ihe ụtọ ma obu ọñụ mere na ya. Ị na-amụmụ ọnụ ọchị kwa mgbe kwa mgbe mana ọ dighị erute n'ime obi gị. Ị na ebili n'aga ... bilie gawa. Ebe ọbụla. Ma ị maghị ebe ọ biliri wee gawa!

Nke a bụ atụmatụ ihe omume gị kwa ụbọchị na atụmatụ ndụ bu ezie ị ga-eji merịe ike ọgwụgwu a dị n'ime ahu gị na n'obi gị. Ụbọchị ọ bụla nke Onye-nwe-anyị ji mmesapụ aka nye gị bụ ohere ọhụrụ iji jiri otuto jikwaa ụbọchị gị. Chineke nyere gị ụbọchị nke taa ma mee ya kpọmkwem maka gị n'uche Ya. Ọ nwere atụmatụ maka gị ụbọchị ọ bụla nke ndụ gị nke na-agụnye ito Ya otuto mgbe niile n'ụzọ bara aba. Ọ bụrụ na ị chọrọ mmesi obi ike na ị na-ekere òkè n’uche Chineke maka ndụ gị kwa ụbọchị, ọ dị mkpa ka ị jiri otuto malite ụbọchị gị, na-emejupụta ya n’ofufe nakwa na jiri ekele mechie ya. Site n'oge ị na-eteta ura na ruo n'echiche ikpeazụ gị tutu gị alakpụọ ura n'abalị, mee ka ọ bụrụ nhọrọ nke uche gị naanị ibuli Onye-nwe-anyị elu ma emekatakwala jụo Ya ajụjụ. Anyị abụghị ndị na-ata Onye-nwe-anyị ụta, anyị bụ ndị na-agọzi Ya!

Igodo: ụbọchị_iri abụọ na otu
ụbọchị_iri abụọ na otu - "Afghan" bụ blanketị.

http://bit. ly/afghanblanket!

Okwu Chukwu

Ụbọchị 20Ụbọchị 22

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: www.justjoyministries.com