Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Ọ bụ ahụmahụ m na ọ na-esiri m ike "imezi" omume nke ndị mmadụ na-enye nsogbu na ndụ m. Iji mmetụta uche na-azaghachi ndị àgwà ha jọgburu onwe ha adịghị arụpụta mgbanwe na-enweghi mgbagha. Ekwenyere m na eleghị anya, Chineke tinyere gị n'ime ndụ ndị ahụ àgwà ha jọgburu onwe ha na-abụghị ime ka omume ha dị mma, kama ikpe ekpere maka ha. Ọ bụ nha nhata dị mfe nke Chineke na-enye anyị ka anyị ji na-emeso ndị mmadụ ahụ na-akpasu anyị iwe ma na-enye anyị nsogbu: Ịhụnanya + Ekpere = Mmeri.
Atụmatụ Chineke adịkarịghị agụnye mmetụta uche mana ọ na-enwekarị njupụta ịhụnanya na ekpere agwokoro onu maka nkwubi okwu mmeri. Chineke ekeghị gị ka ị bụrụ udi mmadu nke na-eji okwu na-atugbu, na-emeru ahu, nakwa na-achịkwa ndị mmadu. Chineke kere gị ka ị bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị nke na-etinye aka n'Alaeze Ya karịa onwe gị. Ndị mmadu àgwà ha jọgburu onwe ha nwere ike ịgbanarị okwu gị, mana ha enweghị ike ịgbanarị ekpere gị. Anyị enweghị ike na anyị ekwesighị inwe ịkpa ókè n’ihe anyị kweere na otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe, n’agbanyeghị otú àgwà ha siri jogbuo onwe ya.
Enwere ihe ọgwụgwọ banyere ilu na ọnụma; a na-akpọ ya obiọma. Enwere ụzọ isi merie iwe na nsogbu; a maara ya dị ka obi ida jụụ. E nwekwara ụzọ isi merie nkwutọ; a ghọtara ya dị ka mgbaghara.
Ọ na-ewe Onye Kraịst tozuru okè n'àgwà ọma, nke na-asọpụrụ Chineke, iji gọzie ndị na-akpagbu ya ná ndụ. Anyị na-eji ire anyị, àgwà obi anyị, mmetụta uche anyị na omume anyị iji gọzie. Ụfọdụ n'ime unu nwere ike na-eche, "Ee, ma Carol, ị maghị nwanne mama m Matilda! Ọ bụ ihe a na-apụghị ịhụ n'anya n'ụzọ ọ bụla a pụrụ ichetụ n'echiche!" O nwere ike ị gaghị achọ ịnụ nzaghachi m banyere nwanne mama gị Matilda mana nke a bụ ya, Ọ nwere Onye hụrụ nwanne mama gị Matilda n'anya ma aha ya bụ Chineke, ya mere malite ime ka Nna gị!
Anyị niile bụ ndị a na-apụghị ịhụ n'anya n'ụzọ ụfọdụ, ka ị ga-asi na anyị a bụghị? Anyị niile nwere ike ịdị na-akparị mmadụ, na-ekwu okwu na-akpata esemokwu na na-enye nsogbu site n'oge ruo n'oge, mana e kwenyere m na ihe kpatara ọtụtụ n'ime anyị na-abu ndị a na-apụghị ịhụ n'anya bụ n'ihi na n'ime ime anyị, anyị na-eti mkpu ka a hụ anyị n'anya. A ga-enwe ọtụtụ oge na ndụ mgbe mkpebi gị ịhụ n'anya mmadu ahu àgwà ya di ka anụ ahu ogwu jupụtara n'ahu ya ga-eme ka ha kwusi idi njo kpamkpam.
Ọ bụrụ na ị jụ ịgbaghara ma gọzie ndị àgwà ha jọgburu onwe ha na ndụ gị, ị nọ n'ihe ize ndụ nke ịghọ onye àgwà ya jọgburu onwe ya. Nha nhata a enyere gị agaghị ada mba na ọ ga-enyekwa gị mmeri n'ikpeazụ:
Ịhụnanya + Ekpere = Mmeri!
Igodo: ụbọchị_iri abụọ
ụbọchị_iri abụọ!

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com