Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Nhụchatụ

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

ỤBỌCHỊ 15 NKE 30

Chineke nwere ihe ngwọta maka ike ọgwụgwụ; Ọ nyewo "na-anọgide" maka mkpụrụ obi gị nke ike gwụrụ na nke n'enweghị ume. Ihe nke mmụọ na-emegide ike ọgwụgwụ bụ ịdị mfe nke inọgide n'ime Kraịst.

Anyị na Jizọs Kraịst kwesịrị ina anọgide na mkpakọrịta n'aganihu, na-adịghị agbabi agbabi. Nke a abụghị nleta otu ugboro n’izu, kama a na-akpọ anyị ka anyị wulite ndụ anyị gburugburu ọnụnọ Ya. Atogboola ute nnabata maka gị ka ị wee mee ọnụnọ Ya ezi ụlọ gị. Ọnụnọ Ya abụghị ebe nzere mmiri maka oké ifufe ma ọ bụ ọmarịcha ụlọ nke ezumike, mana ọ bụ ebe ị nwere ike iwuli ndụ gị ma ghara, aghara ịpụ! Mgbe ebe obibi gị na-adịgide adịgide bụ ọnụnọ nke Kraịst ma gị a na-ahapụ Ya ka Ọ na-atụpenyere gị na ntị gị atụmatụ maka ụbọchị ọ bụla, awa ọ bụla na ọbụna oge dị iche iche nke ụbọchị gị, ọ bụ mgbe ahụ ka mkpụrụ Ya dị ebube ga-apụta ìhè nke ọma ma mukee n'ụzọ dị ụtọ n'ime ndụ gị nke agbara mmiri nke ọma.

A sụgharịrị okwu ahụ bụ "nọgide" n'asụsụ Grik dị ka "ịnọrụ ruo ikpeazụ ma ọ bụ ịdịgide n'ịtachi obi." Mgbe ị na-anọgide na Kraịst kwa ụbọchị ka ị na-enyeju onwe gị afọ site na máná nke Okwu Ya ma na-enweta ọgbụgba ume site na mmiri dị jụụ nke egwu ofufe, ị ga-emerịrị ekwensu na atụmatụ ya maka gị. Ị gaghị abụkwa nwanyị nke na-echegbu onwe ya na nke ike gwụrụ mana ị ga-abụ ihe oyiyi ahụike na ịhụnanya azụlitere ka ị na-anọgide naanị na Kraịst.

Igodo: ụbọchị_iri na ise
ụbọchị_iri na ise.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 14Ụbọchị 16

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: www.justjoyministries.com