Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Otu akwụkwọ nkọwa okwu maka Akwụkwọ Nsọ na-akọwa ike ọgwụgwụ dị ka, “enweghi ume; ida mba; enweghị ike eji aru ọrụ ma ọ bụ ike eji eguzogide; ike ọgwụgwụ, iria oria, enweghị ike ọbula ma oli, ike igwuru mmadu ruo mkpịsị ukwu ya na ike inwe ndidi igwu mmadu."
Eleghị anya, akwụkwọ nkọwa okwu maka Akwụkwọ Nsọ kọwara ihe ị bụ ugbu a! N'ọnọdụ a n'ele anya, nke ahụ bụ "gị" nke onye iro chọrọ ka ị bụrụ. Ekwensu di aghugho, di nduhie na di nzuzo, ọ ga-emekwa ka ike gwụ gị n'ụzọ ọ bụla ọ nwere ike ime ya. Ụzọ idi ike ọgwụgwụ bụ nke dị mkpụmkpụ nakwa ị ga-abata n'ike ọgwụgwụ ngwa ngwa karịa ka ị chere.
Ekwensu, bụ nnukwu onye iro gị, chọrọ ka ike gị gwụ gị na ka ị na-agbaghari ka onye ara na ndụ gị niile. Ka ị na-etinyeju ngwongwo, ihe na iru ọrụ n'ndụ gị, ọ na-achịsị gị ọchị ike n'ihi na ọ maara na ọ meriela agha nke a.
Ekwensu ji irugbu ọrụ na mmegide nke ihe ugbu a di ngwa ngwa eme ka ike gwu ndị nsọ nke Chineke. Ekwensu maara na ị gaghị emeri n'agha ọ bụla ị na-alụ ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ike gwụ gị. Gini ga-efụnahu gị? Ọ bụghị nzọpụta ebighị ebi gị, n'ezie, ma ị ga-efụnahu obi umeala gị na ndidi gị. Ị ga-efụnahu uzo di nma ikwesiri iji chee echiche na udo nke uche gị. Ị nwere ike ifụnahu obi okike gị na otu idebere iji eme ihe kwa ụbọchị.
Atụmatụ ekwensu bụ ime ka ị na-arụsi ọrụ ike na idọpụ uche gị ka ọ si na isi okwu nke ndụ pụọ ka na ị na-ebi ndụ na-abaghị uru, ndụ ike gwụrụ karịa ibi ndụ bara ụba. Ekwensu adịghị eji ihe ọjọọ a na-ahụ anya anwa gị kama ọ na-anwa gị jiri ihe di ka ọ dị mma. Ekwensu ga-eji ihe yiri ka ọ dị mma kpoo gi oku ka ị pụọ n'ihe kacha mma Chineke debere maka ndụ gị. Kedu ihe di nma na-adọpụ uche gị n'ihe kacha mma nke Chineke taa? Ihe di nma nwere ike ime ka ike gwụ gị, mana ihe kacha mma nke Chineke ga-agba gị ume mgbe niile ma weta udo ná ndụ gị.
Ọtụtụ mgbe, mgbe m na-enwe mmetụta nke ida mba nke ukwuu, a na m agwa ekwensu na ndị ajo mmụọ ya niile, "Unu gaghị eme ka m daa mba - a ga m eji egwu ofufe na Okwu nke Chineke mee ka unu daa mba!" Mgbe i kwuchara nkwupụta ahụ, malite inyochagharị nhọrọ ndi ịmere ka i wee gbabie usoro ike ọgwụgwụ na ndụ gị. Kpebie taa na ị gaghị etinye onwe gị n'ọrụ ngwa ngwa, kama na ị ga-etinye onwe gị na ọzụzụ dị ebighi ebi, di mkpa. Kweere m n'nke a, ọ bu naanị ime nhọrọ ole na ole di ezigbo mkpa ka ị ga-ema iji jiri udo Chineke zuru oke wee dochie ike ọgwụgwụ gị.
Igodo: ụbọchị_iri na anọ
ụbọchị_iri na anọ.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com