Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Mgbe mama m na papa m lụrụ, e nyere ha tebụl ochie sitere n'aka nne na nna papa m. Tebụl a anọwo n'ụlọ ọkụkọ ha ruo ọtụtụ iri afọ, mana nne muru papa m chere na ndị mụrụ m nwere ike iji ya mee ihe n'ụlọ ha ka ha lụrụ ọhụrụ. Uzuzu, nsi ọkụkọ na ọtụtụ abuba ọkụkọ sitere n'ọgbọ kwa ọgbọ ọkụkọ kpuchiri tebụl a. Nne muru papa m nwara ihicha ya mana ọ chọpụtara na nke ahu agaghị ekwe omume, ya mere ọ ji jiri agba n'acha oliv grịịn kpuchie ihe ndia niile n'aso oyi.
Tebụl a n'esị ịsị, eji agba olive grịịn tegharia nọdụrụ n'akuku mpaghara ụzọ anyi si agafe n'ulo elu anyi oge ahu niile m bụ nwata.
Nne m n'ikpeazụ kpebiri iwepụ agba oliv grịịn ahu di na tebụl ahu. Ọ wegaara ya otu enyi ezinụlọ anyị bụ́ onye hiwere ụlọ ahia mmeghari n'ime ebe a na-adọba ụgbọala ya.
Otu ụtụtụ ka Mama m buuru tebụl ahu gaa dobe n'ụlọ ahia enyi ezinụlọ anyị a ka a ruo ya ọrụ, mana n’echi ya, Maazị C. kpọrọ mama m ma gwa ya ka ọ bịa buru tebụl ahu. Mama m buuru n'uche na odighị otu enyi anyị ahu ga-esi megharia tebụl ahu ngwa ngwa otu ahu, ya mere ọ jiri jụọ ya otú ọ si rụchaa ọrụ di na tebụl ahu n'ime nanị awa iri abụọ na anọ.
Maazị C. kọwara, na ka ọ na-enyocha ihe ndị digasị n'tebụl a ana ekwu okwu ya, ọ ghọtara na e mere ya n'oge Agha Mgbanwe, na nke a bụ ihe nketa dị oke ọnụ ahịa. Maazị C. kwuru na ọ na-echetara ya maka ihe ndi eji ebi ụlọ e mere maka George Washington n'onwe ya! Ọ jụrụ imetụ ya aka ma gwa mama m na ọnụ ahịa ya karịrị puku kwuru iri puku dollar.
Mama m siri ọnwụ na Maazị C. bụ onye ọ chọrọ ka ọ megharia ihe nke a so n'ihe ncheta ihe ndị mere eme. Ọ weere Maazị C. ọtụtụ ọnwa iji jiri ezigbo obi umeala meghachi tebụl a n'ọnọdụ ọ di n'mbụ. Mgbe Maazị C. wepụchara unyi di n'tebụl ahu, ọ malitere ịhicha ya ezi nhicha - ichọ ya nma - na iweghachi ya ka ọ dị otu ọ kwesịrị isi maa nma.
Ị bụ tebụl ahu a na-ekwu okwu ya - e mere gị ka e jiri gị kpọrọ ihe na lekọta gị. Ma kama, ị họrọla ibi ndụ n'ime ulọ ndụ nke anụ ọkụkọ ma ọ jirile nsi ọkụkọ, abuba ọkụkọ na unyi nke ọtụtụ iri afọ kpuchie ihe ị bụ n'ezie. Ma mgbe nke a mesiri, otu onye dị ka ọ bụ ihe oma n'obi, na-ahụ maka ọdịmma nke onwe onye e tezuola gị agba n'eme ka ọgbụgbọ họwa mmadu. Chineke chọrọ iwepụ ihe ndị ahụ niile ma jiri nwayọọ na n'ịhụnanya weghachi gị n'ịdị mma nke okike Ya. Ị ga-ekwe ka Ọ mee nke ahụ? E kere gị n'onyinyo Ya ka ị bụrụ akụkụ nke atụmatụ Ya n'oge a ana akọ ihe mere eme.
Igodo: ubọchị_Iri na atọ
ubọchị_Iri na atọ.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com