Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Owu ọmụma na-adị ka ọ nweghị onye na-eche banyere gị ma ọ bụ maka ndụ gị n'ezie. Owu ọmụma nwere ike ịbụ mmetụta nke kacha ebibi ndụ mmadu. Ọ bụrụ na Ekwensu enweghị ike iji nchegbu na ụjọ mee ka ị daa, ọ ga-agba mbo ikewapụ gị ná mmekọrịta dị mma n’ihi na ọbụna Ekwensu maara ike mmadụ abụọ nwere!
Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị gị ka ịnọ naanị gị, ị ghaghị ichetara onwe gị na ọ dịghị mgbe ị nọ nanị gị n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-ekwe nkwa ya. Nke a bụ otu n'ime oge ndụ di mkpa mgbe ị ga-echetara onwe gị na mmetụta gị niile abụghị eziokwu. Mgbe obi gị na-agbalị ịgwa gị na ị nọ naanị gị nakwa na ọ dịghị onye na-eche banyere gị ná ndụ gị, obi gị na Ekwensu na-akpakọrịta ma na-ege ntị n'ụgha ya dị egwu.
A bịa n’ihe gbasara owu ọmụma, ị ghaghị imepe Akwụkwọ Nsọ gị ma kwenye n’Okwu Chineke, kama ikwenye n’obi meere m ebere gị. Okwu ikpeazụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya chetaara ha na ọ bụ ezie na ha agaghị enwe ike iji anya ha hụ Ya ọzọ, na Ọ ga-anọnyere ha mgbe niile: "A nọnyeere M unu mgbe niile, ọbụna ruo ọgwụgwụ ụwa" (Matiu 28:20).
Isiokwu abụ Jizọs bụ na ị gaghị eje ije naanị gị. Ọ nwekataghi gị ejee ije nanị gị. Ụgha ahụ Ekwensu na-agbọputa na-ekwu banyere nanị mmetụta anyị, ọ bụghịkwa eziokwu ime mmụọ. Eziokwu Akwụkwọ Nsọ bụ na ịhụnanya na nlekọta Chineke gbara gị gburugburu kwa ụbọchị nke ndụ gị. Ọ dịghị ihe ga-ekewapụ gị n’ịhụnanya nke Chineke; nlekọta ịhụnanya Ya gbara gị gburugburu na ntụkwasị obi n'ihi na Ọ kwere nkwa ya. Owu ọmụma bụ ụgha - ụgha na-enweghị isi na ịkpọasị nke ga-eme ka ị na-ajụ ajụjụ banyere eziokwu nke Okwu Chineke na-adịghị agha agha.
Jizọs bụ ezigbo enyi gị n'ezie, ya mere malite ime otú ahụ site n'ụbọchị taa. Gwa Jizọs ihe di n'obi gị ma gee ntị ka ị nụ otu Ọ ga-esi zaa gị. Were otu mgbede dum jiri egwu ofufe na akpọ na nguputa Okwu Chineke nọrọ n'ihu Ya. Deere ya akwụkwọ ozi ịhụnanya dị ogologo na nke chiri anya ma jiri obi gị niile bụọra Ya abụ mgbe ị nọ n'ihu Ya. Mgbe ị malitere ịmeso Jizọs otu ị ga-esi na-emeso enyi gị, owu ọmụma gị ga-ebido ikwụsị ma gwu kpam kpam, a na m ekwe nkwa ya!
Igodo: ụbọchị _ iri na asaa
ụbọchị _ iri na asaa!

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com