Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

ỤBỌCHỊ 18 NKE 30

Mgbe anyị na ibe anyị nọ, Ọ nọnyeere anyị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Chineke na-anọrị, gbalịa ka gị na ìgwè ndị hụrụ Ya n'anya nọrọ otu mgbede. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ịnọ naanị gị, kpọọ ụfọdụ ndị nwere mmasị ikpe ekpere, mgbe i mere nke a, kedu ònye ọzọ iche ga-esi n'ọnụ ụzọ gị gabata?

Chineke bi ebe otuto jụpụtara ma sie ike. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Ọ gosipụta Onwe Ya n'ezie ma mee ka i mara Ya, ị kwesiri ibi ndụ gị niile n'ofufe Ya. Chineke na-egosi Onwe Ya mgbe nwoke ma ọ bụ nwanyị nke Chineke na ejiri obi nke jupụtara na ofufe dị ọcha na-emegide ihe n'eme ya na ọnọdụ ndi gbara ya gburugburu. Ọ bụrụ na ị na-enwe mmetụta nke owu ọmụma, gbalitecha egwu ofufe gị ma welie aka gị elu n'ihi na Ọ nọ ebe ahu! Ị nọghị sọ gị. Na-abụputa abụ n'olu dara ụda na n'olu ike! Ọ nọ ebe ahụ! Ị nọghị sọ gị. Na-abụ abụ n'ụgbọ ala na n'ime ebe ina asa ahụ ma Ọ ga-anọnyere gị. Mgbe ọ bụla ị mere mkpebi nke ife ofufe, ị etinyela onwe gị ozugbo n'ihu Ya. Ị nọghị sọ gị. Ịnwekataghi di otu ahu.

Ọ bụrụ na m bụ dọkịta, echekwara m na m bụ ... Abụ m dọkịta nke mkpụrụ obi, ya mere ka m deere gị ọgwụ maka owu ọmụma. Nye onye ọzọ n'enwekwa owu ọmụma ọgwụ a ugboro atọ n'ụbọchị. Owu ọmụma gị ga-enwe ngwọta mgbe ị na-eche maka mkpa onye ọzọ karia maka owu ọmụma gị. Were ọnụ ochi gozie onye ịna amaghị n'azu ihe oriri n'ụlọ ahịa. Degara enyi ochie kọleji gị akwụkwọ ozi ma gị na ya jikọkwa ọzọ. Adịla n'emeghi ihe ọbula ma n'anọ n'ụlọ na-ekiri ihe nkiri, n'ihi na ị ga-achọpụta na inye ihe bụ ọgwụgwọ mgbe niile maka owu ọmụma.

ụbọchị_nke iri na asatọ.
Ụbọchị 17Ụbọchị 19

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: www.justjoyministries.com