O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari; O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ. Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba: Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ. Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya: Ma ngọzi n'isi onye nēre ya. Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ: Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya. Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú. Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe: Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe. Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu. Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?
Gụọ ILU 11
Geere nke a ntị ILU 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 11:24-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị