Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 11

11
1Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova:
Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ.
2Nganga bia, nlelì abia kwa:
Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di.
3Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha:
Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.
4Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe:
Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.
5Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi:
Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da.
6Ezi omume nke ndi ziri ezi gānaputa ha:
Ma n'ọchichọ nke ha nāchọsi ike ka agānwude ndi nāghọb͕u aghọb͕u.
7Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì:
Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì.
8Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu,
Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.
9Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya:
Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume.
10N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ:
Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di.
11Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo:
Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya.
12Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya:
Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti.
13Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo:
Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu.
14Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda:
Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.
15Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe:
Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi.
16Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike:
Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike.
17Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu:
Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu.
18Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha:
Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi.
19Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu:
Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.
20Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu:
Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu.
21Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ:
Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.
22Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì,
Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di.
23Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe:
Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe.
24O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari;
O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ.
25Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba:
Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ.
26Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya:
Ma ngọzi n'isi onye nēre ya.
27Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ:
Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya.
28Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda:
Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.
29Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe:
Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe.
30Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu;
Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu.
31Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa:
Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 11: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye