Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 12

12
1Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya:
Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.
2Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ:
Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.
3Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:
Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.
4Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya:
Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.
5Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé:
Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.
6Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara:
Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.
7Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa:
Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.
8Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula:
Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.
9Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù,
Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.
10Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya:
Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.
11Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:
Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.
12Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike:
Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.
13Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di:
Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.
14Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe:
Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.
15Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya:
Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.
16Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya:
Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.
17Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume,
Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.
18O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha:
Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.
19Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi:
Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.
20Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ:
Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.
21Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume:
Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.
22Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu:
Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.
23Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma:
Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.
24Aka ndi di nkọ gāchi achi:
Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.
25Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala;
Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.
26Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ:
Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.
27Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá:
Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.
28N'uzọ ezi omume ka ndu di;
Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 12: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye