Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

ỤBỌCHỊ 5 NKE 30

Mmetụta uche gị na-eme njem nde iri asatọ ngwa ngwa karịa ka echiche gị na-eme njem. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe ịtụnanya? Otu ihe ọmụma a dị ịtụnanya na-enyere anyị aka ịghọta ihe kpatara na mgbe ihe ọjọọ mere, anyị na-enwe mmetụta n'enweghị njikwa na nke n'enweghị nrube isi, ma anyị enweghị ike icheta ozugbo ihe anyị ga-eme ma ọ bụ onye anyị ga-akpọ. N'aka nke ọzọ, ọ bụkwa eziokwu mgbe ihe magburu onwe ya mere na obi anyị rukpuru n'ime ụtọ nke mkpali mmetụta uche, n'oge ahụ kwa, anyị enweghị ikike ikpebi kpọmkwem ihe anyị ga-eme na-nsote. Echiche niile bu ezi uche na nke bara uru na-abata na etiti akwara anyị ogologo oge mgbe mmetụta ahụ gosipụtachara onwe ya.

Ike dị itụnanya dị ukwuu otu mmetụta uche anyị si emmeghachi omume ngwa ngwa nye ndụ na-enye aka ịkọwa ihe mere, ọbụna Ndị Kraịst, na-ejikarị eme ihe site n'mmetụta uche kama ime ihe otu ọ kwesịrị. Ihe - ma ọ bụ Onye - kwesịrị ijikọ mmetụta uche gị nke na-eme njem n'igba ọsọ mgbajiukwu ma manye ha idobe onwe ha n'okpuru mkpụrụ nke dị naanị na Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ na ị nọgide na-ekwe ka mmetụta uche gị na-akpagharị gị ka onye efulefu ná ndụ, ị ga na-ekwukarị ihe ndị na-emenye ihere, na-eme ihe ndị na-adịghị mma, ghara ịbụkwa onye Chineke zubere ka ị bụrụ. Ị ga-emesị nwee n'ikpeazu odi n'ahu nke n'efe oso, dị mgbawaputa ọkụ nke na-ebibisi onye ọ bụla no n'ụzọ iwe ya na nke ịme ihe mmebi ya.

Ọ dị ntakịrị ihe dị mkpa na ndụ karịa inwe njikwa ihe ndị gbasara obi gị.

Mgbe ejiri okwu ahụ bụ "obi" mee ihe, karịsịa na Agba Ochie, ọ na-ezo aka na mkpụrụ obi mmadụ ma ọ bụ ebe ọmụmụ nke ima ihe, mmetụta uche na mmasi. Obi gị bụ ihe na-ekpebi otú ị ga-esi eme ihe n'ọnọdụ ọ bụla ma bụrụ oche nke uche na nzube gị ná ndụ. Akwụkwọ Nsọ kwuru ka ị ‘chebe’ ma ọ bụ ‘lebara anya’ akụkụ nke ndụ gị ahụ nke ọma.

Obi gị bara uru nke ukwuu nye Chineke, ekwesịkwara ị were ya dịka akụ nke bara nnukwu uru.

Ebe nsogbu dị bụ na obi n'onwe ya: obi gị achọghị ka echebe ya. Ọ na-achọ ikwupụtasi onwe ya na echiche ya niile ike. Obi gị na-anụ ọkụ maka ịkuputa, ịgbọputa na ịkpọpụta mmetụta ọ bụla ọ nwetụrụla. Ọ dịghị mgbe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ekwere ka anyị na-ekwupụta ihe niile dị anyị n’obi - ọ na-ekwu naanị ka anyị chebe ya.

Igodo: ụbọchị_ise
ụbọchị_ise

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Holy Emotions - Biblical Responses to Every Challenge

Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: www.justjoyministries.com