Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Ị nwere mkpụrụ obi ma nwekwa mmụọ.
Mmụọ gị bụ akụkụ dị elu nke ime mmadụ gị ma mkpụrụ obi gị dị ala. Mmụọ bụ ụkpụrụ ndụ nke Chineke nyere mmadụ ma bụrụ akụkụ nke gị nke na-ahụta ma na-aghọta ihe ndị ebighi ebi. Ị gaghị eje ije n'okwukwe n'eleghị anya n'ihe ị na-ahu ma ọ bụrụ na ị nweghị mmụọ. E mere mmụọ gị ka ọ na-eje ije site n'okwukwe ma mkpụrụ obi gị nwere ikike naanị nke ije ije site n'ihe ọ na-ahụ.
Martin Luther kwuru sị, "Mmụọ bụ akụkụ kachasị elu na nke kachasị mma nke mmadụ nke na-eme ka ọ ruo eruo ijide ihe a na-apụghị ịghọta aghọta, ihe dị ebighi ebi, na ihe a na-adịghị ahụ anya."
Mkpụrụ obi gị bụ oche nke àgwà gị, mmetụta gị, ọchịchọ gị, mmetụta ịhụnanya gị na ịkpọasị gị. N'ụzọ dị mfe, mkpụrụ obi gị bụ ebe ọmụmụ nke ụdị mmetụta mmadụ niile. Mgbe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu maka mkpụrụ obi gị, ọ na-ekwu maka nke na-achịkwa otu i si emeghachi omume mmetụta uche gị nye ndụ.
Na Luk 12, Jizọs kọrọ akụkọ banyere otu onye ọrụ ugbo bara ọgaranya bụ́ onye nwere ihe ịga nke ọma nke ukwuu ma na-arụpụta ihe. Mgbe onye ọrụ ugbo a bara ọgaranya nke ukwuu nke mere na ọ nweghịzị ebe ọ ga-edobe ihe ubi n’ihi na ihe ubi hiri nne, ọ kpebiri ịkwatu ọba ya na-ezughị ezu ma wuo ndị buru ibu ma dị oké ọnụ ahịa. Nwoke a nwere oké obi ụtọ banyere ezi akụ̀ ya nke mere na ọ gwara mkpụrụ obi ya, sị: “Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ihe akpakọbara ruo ọtụtụ afọ n’ihu; nwee ahụ iru ala, rie, ñụọ, nweekwa obi ụtọ" (v. 19).
Chineke nụrụ atumatu nwoke a bu onye nganga ọ wee wute Ya maka mkpebi nwoke a ibi ndụ nke naanị irụpụta ihe onwunwe n’echeghị echiche banyere ebighị ebi. Onye ọrụ ubi ahụ, bụ́ onye mkpụrụ obi ya jupụtara n'ọñụ na ọba ya jupụtara n'ụba, nwere mmụọ nke tọgbọrọ chakoo na nke nwụrụ anwụ.
Ọtụtụ Ndị Kraịst na-emehie otu enyi anyị ahụ bara ọgaranya mere n’ilu Jizọs. Anyị na-aga n'ihu na-azụ mkpụrụ obi anyị na nri kwesịrị nke mmụọ anyị. Ọ bụrụ na ị na-etinye ndụ gị n'ilekwasị anya na ihe ụtọ ụwa na ọchịchọ nke mmetụta uche, mgbe ahụ mkpụrụ obi gị ga-etolite n'enweghị njikwa. Kwe ka m jụọ gị ajụjụ dabara adaba nke ukwuu ka anyị na-ahụ maka mmetụta anyị na-enweghị njikwa, Kedu akụkụ ahụ gị dị mma na nke siri ike n'ime gị? Mkpụrụ obi gị? Ka ọ bụ mmụọ gị? Maka Onye Kraịst ọ bụla, azịza doro anya na nke n'enwu ọkụ n'obi bụ, "Mmụọ m!"
Igodo: ụbọchị_isii
ụbọchị_isii

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com