Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Ị ga-abụ n'ezie onye Chineke kere gị ka ị bụrụ mgbe ị nwetara ike nke Ọ kere ka ị nweta. Enwere m ike ịbụ onye nwere mmetụta uche dị ọkụ nke mere na naanị ihe m nwere ike ime n'onwe m bụ iche echiche banyere onwe m na otú ọ dị m. E keghị gị maka ikwupụta mmetụta uche gị na-enweghị nchịkwa; e kere gị maka mkpụrụ, maka ezi ọrụ, maka Ala-Eze Chineke na maka ike!
Enwere nkebiokwu abụọ dị iche na akwụkwọ nsọ nke anyị na-agụ taa bụ ndị na-agbanwe ndụ ga-etinyekwa gị n'ime ọdịnihu mmetụta uche gị. “Ị ga-anata ike,” bụ eleghi anya nkebi ahịrịokwu kacha atọ ụtọ na agba ọhụrụ nke akwụkwọ nsọ. Ị ga-anata ike! Ị gaghị eji ike nke gị na-aga ije n'ata ahụhụ na ndụ! Ị gaghị enwe afọ ojuju na mmetụta uche n'aru afọ na ibu nke si na nna nna gị! Ị gaghị enwe ikike ichịkwa mmetụta uche gị n'enwe ka ọkụ ma o bụrụ na ị nwetaghi ike nke Mmụọ Nsọ.
“... Unu ga-abụkwa ndị akaebe M,” bụ nkwa nke abụọ na-akpali akpali n’amaokwu a a ma ama. Ịnata ike nke Mmụọ Nsọ na-enyere gị aka ịbu onye Chineke kere gị ka ị bụrụ! Ị nwete ike Chineke di gị mkpa ka ị bụrụ onye akaebe nke ọdịdị Ya n'oge a a na-akọ ihe mere eme. Ị ga-anata ike na ị ga-abụ!
Ị gaghị abụ ihe niile Chineke zubere ka ị bụrụ ma ọ bụrụ na ị nwetaghi ike Ya. Jizọs maara na anyị agaghị enwe ike ibi ndụ bara ụba n'ụwa ma ọ bụrụ na anyị enweghị ike nke Mmụọ Nsọ, ya mere Ọ jiri nye ike nke ahụ kpọmkwem. Ana m ahu onwe m ka m na-ekpe ekpere a ọtụtụ ugboro n'ụbọchị n'ihi na abụ m nwanyị na achọsi ihe ike:
Mmụọ Nsọ, mee ka ike Gị ju m n'ahu! Achọrọ m ihe niile Ị nwere maka m, achọrọ m onyinye Gị na mkpụrụ Gị. Achọrọ m ike Gị karịa ihe ọ bụla ọzọ taa. Ọ bụrụ na Ị chọrọ ka m kpee ekpere maka ọrụ ebube na ọgwụgwọ, aga m eme nke ahu, ya mere tinye m n'ime ndị ga-enweta ike Gị! Achọrọ m ihe niile Ị nwere maka m. Achọrọ m ndidi na njide onwe onye nakwa udo na ọñụ na ịhụnanya. A ga m ewere ike ọbula Ị tugara n'ụzọ m otu ọbụna ọ di.
Ma gịnị ka ị ga-eme mgbe I kpechara ekpere a? Ka ọ di ... ị ga-eme ihe ndị mmadụ n'enwe mmetuta uche n'enwu ọkụ na-akpọ asị ime n'ihi na mgbe ahụ - ị ga-echere.
Igodo: ụbọchị_ato
ụbọchị_ato.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com