Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka ỌbụlaIhe Atụ
Ndụ anyị abụghị nke anyị, ma Chineke enyefewo ha n’aka anyị. Laghachiazụ ma gụọ ahịrịokwu nke mbụ ahụ ọzọ: Ndụ anyị abụghị nke anyị, ma Chineke enyefewo ha n'aka anyị. Ọ bụ otu n'ime mgbagwọjụ anya dị nsọ na-eme ka anyị jiri oke ịtụ-n'anya n'ele ihu Chineke anya.
Ọ bụ eziokwu - ị bụ ọrụ aka Chineke. Ekèwo gị n'ime Kraist Jizọs n'ihi naani otù nzube: n'ihi ọru ọma nke Chineke zubere kpọmkwem banyere gị tupu oge ebido. Ọ bụ atumatu Chineke ka ị na-eje ije na ndụ nke Ọ zubere ma kwadoo maka abamuru gị. Mana, nhọrọ nke a ka dị gị n'aka. Ị nwere ike ime ihe otu ị si chọọ ma ọ bụ mee ihe n'ụzọ Chineke.
N'agbanyeghi na ị bụ nke Chineke n'ihi na Ọ kere gị ma buru uzo chepụtara gi ndụ dị oke ịtụ-n'anya, Ọ ka tinyere nhọrọ maka ndụ ebube ahu n'aka gị. Otu n'ime ihe atụ kachasị dị irè nke ebe anyị na-ahọrọ Chineke ma ọ bụ họrọ onwe anyị bụ na mmasị na omume mmetụta uche anyị. Ị ga-ahapụrịrị ikike gị ịkwa ákwá na ịme ntanwu wee jiri obi gị dum nabata atụmatụ nke Chineke maka ndụ gị, nke a na-achọta n'ime mkpụrụ nke Mmụọ. E kere gị maka ezi ọrụ, ọ bụghị maka ọrụ anụ ahụ ma ọ bụ maka echiche nke mmetụta uche gị.
Ọrụ ọma ndị Kraịst zubeere maka gị tupu a mụọ gị dị nnọọ ukwuu karịa ịgụ akwụkwọ maka ofufe ma ọ bụ ige egwu ofufe. Ọrụ ọma nke Chineke bu n’obi mgbe Ọ chere banyere gị dị ezigbo ebube nke mere na Ọ kwuputara n’oge niile na gị bụ ọrụ aka okike Ya nke Ya Onwe Ya kere. Anya Chineke di n'ebe inọ site na mmalite oge ime ihe pụrụ iche site na ndụ gị nke ga-eme na ọbụna ndị mmụọ ozi ga-eguzo n'ịtụnanya na agụụ ime ihe e kere gị ime!
Igodo: ụbọchị_abụọ
ụbọchị_abụọ!

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Carol McLeod na Just Joy Ministries maka iwepụta atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na:
www.justjoyministries.com