Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ
Mak 4-5 | Ezi Mkpụrụ & Ezi Unyi
Jizọs bụ onye na-akọ akụkọ pụrụ iche. Na Mak Isi Nke Anọ na Isi Nke Ise, Jizọs tụrụ ilu - akụkọ ndị na-akụzi ihe. Ilu mbụ Jizọs tụrụ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ abụọ dị mkpa: gịnị bụ Akwụkwọ Nsọ na gịnị mere anyị ji kwesị ịgụ ya?
Ka anyị malite na Mak Isi Nke Ano, amaokwu nke ato:
“‘Gee ntị! Otu onye ọrụ ugbo pụrụ ịgha mkpụrụ ya. Ka ọ na-awụsasị mkpụrụ ya, ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, anụ ufe bịakwara rie ha. Ụfọdụ dara n'ebe nkume, bụ́ ebe ha na-enweghị ọtụtụ ala. Ha tolitere ngwa ngwa, n'ihi na ala adịghị omimi. Mana mgbe anyanwụ wara, ihe ọkụkụ ndị ahụ rechara oku, wee kpọnwụkwa akpọnwụ n’ihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. Mkpuru ndị ọzọ dara n'etiti ogwu, ogwu ndị ahu e wee too wee kpagbuo ha, nke mere ha ji ha amighị ihe ubi. Mana e nwere mkpuru ndị dara n'ezi ala. Ha si n'ala pụta, tolite, wee mịa ihe ubi, ụfọdụ mụbara iri atọ, ndị ọzọ mụbara iri isii, ndị ọzọ mụbara otu narị ugboro narị.’
Ka Jisọs tusiri ilu a, O wee si, ‘Onye-obula nwere nti inu ihe, ya nuru ihe ndi a M kwuru.’”
Ya bụ na ilu Jizọs tụrụ bụ akụkọ gbasara ọrụ ugbo. Onye ọrụ ugbo na-akụ mkpụrụ; ụfọdụ mkpụrụ na-eto ma ụfọdụ adịghị eto, dabere na ala a wụsara ha. Ọ bụghị ihe na-atọ ụtọ nke ukwuu, mana Jizọs na-enye anyị mkpịsị igodo nke ilu a n'amaokwu iri na ano:
“Onye ọrụ ubi bu mkpụrụ okwu ka o na-agha.”
Na Luk Isi Nke Asato Jizọs kwuru si:
“Mkpụrụ ahụ bụ Okwu Chineke” (Luke 8:11).
Ya mere, Jizọs ji Okwu Chineke tụnyere mkpụrụ. Chee echiche banyere mkpụrụ. O dighị oke ihe ile anya. Ihe nmiputa na-adọrọ mmasị karịa ya. Mana mkpụrụ dị n'ime, obere ihe ahu na-adịghị ahụkebe, ezowo n'ime ya ụkpụrụ niile na ngwa ọrụ niile dị mkpa iji wuo oke ọhịa, ihe n'eto eto, ma ọ bụ osisi dum - site na mgbọrọgwụ ruo alaka ruo mkpụrụ - ma ihe niile ndị a sitere na unyi. Mkpụrụ dị ịtụnanya: ị na-eli ya o wee kee ndụ.
Jizọs wee na-agwa anyị: Okwu Chineke bụ mkpụrụ. O nwere ike ọ gaghị adị ka ihe ukwu, mana ụkpụrụ nke ndụ dị n'ime ya. Naanị ihe ọ chọrọ bụ ezigbo unyi.
Akwụkwọ Nsọ karịrị akwụkwọ nkiti. Ọ nwere akwụkwọ iri isii na isii n'ime ya. Ma karịa nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ bụ Okwu Chineke. 2 Timoti kwuru si,
“Akwụkwọ nsọ nile bu nke e si n'ume Chineke kuputa” (2 Timoti 3:16).
Nke ahụ pụtara na Akwụkwọ Nsọ na-asi na ya bụ Okwu Chineke.
Ya mere ọ bụrụ na Okwu Chineke bụ mkpụrụ, gịnị bụ ala ahu a kuru ya? Nke ahụ na-eweghachite anyị n'ilu Jizọs tụrụ.
Jizọs kọwara na ala ndị ahu a kuru Okwu Chukwu bụ ndị na-anụ okwu ahụ. Ala ndị ahu bụ mụ na gị. Ọ bụ obi anyị, e nwekwara ụdị ala anọ - obi anọ dị iche iche ma a bịa n’ịnụ okwu Chineke.
Ụfọdụ obi siri ike di ka okporo ụzọ siri ike. Okwu a na-awusa ma ọ dighi abanye. Obi ọzọ dị ka ala nkume. E nwere obere unyi di nma ime ka ihe too, mkpụrụ ahụ na-etolitekwe nke obere, mana mgbọrọgwụ enweghị ike imi emi n'ime ala. Mgbe nsogbu bịara, ha na-ada mbà n'okwukwe. Ufọdụ obi dị ka ala ahụ nke nwere ogwu na ahịhịa, bu ndị ihe ụtọ na nchegbu nke ndụ jidesiri ike, ọ dịghị ohere obula itolite okwukwe. Ma e nwekara ụfọdụ obi na… Ka anyị n'ekwu, ị hụtụla ubi nke bu nnoo so unyi mechara ghọọ ubi ihe otuto n'acha akwukwo ndu akwụkwọ ndụ jupụtara? O bu ihe njuanya.
Ya mere, olee otú ị ga-esi gbasie ike mee ka obi gị bụru ụdị nke na-eto eto? Iji chọpụta, gụọ Mak Isi Nke Ano. Cheta, ike ime nke a dị n'okwu Chineke, ọ dighị n'okwu m. Abịara m ebe a ime ka i malite, mana ezigbo ihe mgbaru ọsọ m bụ ka ị sapee Akwụkwọ Nsọ ma gụọ Ya n'onwe gị.
Olileanya m nwere n’ebe ị nọ bụ àgwà igu Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Nke ahụ bụ akụkụ dị mkpa nke iso Jizọs. Na-agụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị. Kuo ezi mkpụrụ n'ezi unyi ma too ezigbo mkpụrụ.
Ya mere, gụọ Mak Isi Nke Ano na Isi Nke Ise, tụleekwa ụdị ala ị chọrọ ịbụ. Ọ bụrụ na ị nwere oge, gụọ isiakwụkwọ ndị a n'uju, ma soro Jizọs ka Ọ na-akọ akụkọ ndị ọzọ dị ịtụnanya. Ma na-ele anya ka Ọ na-agwa oké ifufe okwu ma mee ka ọ dajụọ, ka O na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọ ndị ọrịa, na na-akpọkwa ndị nwụrụ anwụ ka ha dịghachi ndụ. O n'eme ihe ndị a nile, site n’ike nke Okwu Ya. Ma ọ bụrụ na okwu Jizọs nwere ike ime ihe ndị ahụ niile, chee echiche banyere ihe ha ga-eme ná ndụ gị. Ihe niile di mkpa ka nke a kwe gi omume - bụ ezigbo unyi.
Maka Ntụleghachi & Mkparịta Uka:
- Gịnị mere i ji chee na Jizọs ji maa atụ Okwu Chineke dị ka mkpụrụ? Kedu ka ha si yie?
- Ọ bụrụ na unyi na-anọchi anya obi gị, gịnị ka ị ga-eme iji hụ na a kụrụ Okwu Chukwu n'ezi unyi na o nwere ohere itolite na ịmị mkpụrụ?
- Olee otú ị si hụ okwu Chineke ka O na-emetụta gị na ndị mmadụ di ná ndụ gị? Kekọrịta akụkọ gị.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!
More