Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ

Start Here | First Steps With Jesus

ỤBỌCHỊ 6 NKE 15

Mak 10-11 | Ndụ Ebighị Ebi

Taa, otu nwa okorobịa jụrụ Jizọs otu nnukwu ajụjụ. Mak Isi Nke Iri, amaokwu nke iri na asaa:

"Ka Jizọs malitere n’ụzọ Ya, otu nwoke gbakwuru Ya wee daa n’ala n’ihu Ya. ‘Ezi onye ozizi,’ ọ jụrụ, ‘Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”

Ugbu a nke a bụ ajụjụ. Akwụkwọ Nsọ na-akụziri anyị na ihe anyị na-eme n’obere ndụ a na-ekpebi otú anyị ga-esi ebi ndụ n'ebighị ebi. Ma nwa okorobịa a chọrọ ịma - gịnị ka m ga-eme iji keta ndụ dị ebighị ebi? Kedu ka m ga-esi ruo Eluigwe?

Ya ka ọ na-ajụ ezigbo onye nkuzi. Lee anya otú Jizọs si zaghachi ya. Amaokwu nke iri na asatọ:

"Gịnị kpatara i ji akpọ M ezigbo mmadụ?" Jizọs zara. "Ọ dịghị onye dị mma ma e wezụga naanị Chineke."

Riba ama na Jizọs agaghị gbam zawa ajụjụ ya. Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n’ihi na Ọ chọrọ ikpochapụ ihe ndị ahụ nwoke ahụ kwetara na ha, bụ ihe ndị na-ezighị ezi, tupu Ya akọwaa azịza bụ nke ziri ezi. Ya mere, Jizọs sịrị ya, "Ọ dịghị onye dị mma ma e wezụga Chineke." Nke ahụ dị mkpa.

Anyị na-eme nkewa ụwa dị ka ọ dị n'etiti ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ndị ọjọọ. Mana Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na mmadụ nile emehiewo, na ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume ma e wezụga Chineke n’onwe Ya (Ndị Rom 3:23). Ezi omume pụtara ịzi ezi n’ebe Chineke nọ, na n’ime Agba Ochie, ụzọ nke naanị n'eduga n'ndụ ebighị ebi bụ ezi omume (Ilu 12:28).

Lekwa ihe Jizọs na-ekwu ọzọ. Amaokwu nke iri na itoolu:

"Ị maara ihe ndị e nyere n’iwu…”

O wee na-agụpụta ha: egbula mmadụ, a kwala iko, ezula ohi, a gbala akaebe ụgha, sọpụrụ ndị nne na nna. Ị nwere ike imata ihe ndia site n'Iwu Iri ahu. Amaokwu nke iri abụọ:

"Onye Ozizi,” ka nwa okorobịa ahụ kwuru, “ihe ndị a niile ka m debere kemgbe m bụ nwata."

O doro anya na nwa okorobịa a chere na ọ bụ ezigbo mmadụ. Ma aghọtara m ihe mere ọ jiri chee otu ahụ. Tupu mụ amata Jizọs, echere m n'ezie na m bụ ezigbo mmadụ. Agbalịrị m ka m ghara imegbu onye ọ bụla, mụ abụrụkwa nwoke dị nma.

Ma rịba ama ihe Jizọs hapụrụ. Ọ kwụputara iwu ndị gbasara ịhụ ndị ọzọ n’anya, ma Ọ kwughị ihe e nyere n’iwu banyere Chineke: “Ị gaghị enwe chi ọzọ” na “Emela arụsị” n’ọnọdụ Chineke. Gịnị mere Ọ jiri Ọ kwughị maka ndị ahụ? Amaokwu nke iri abụọ na otu:

"Jizọs lere ya anya wee hụ ya n'anya."

Kwụsịtụ ebe ahụ. Maka Jizọs, mkparịta ụka a karịrị ajụjụ na azịza nke mmụta okpukpe. Jizọs hụrụ ya n'anya. Ya mere Ọ jiri gwa ya:

"Otu ihe ka ị na-enweghị,” ka Ọ kwuru. "Gaa, ree ihe nile i nwere ma nye ha ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ n'eluigwe. Mgbe ị mechara nke a, bịa, soro M."

Ihe itunanya. Naanị otu ihe kọrọ ya maka ndụ ebighị ebi. Naanị otu ihe. Mana gụọ nke ọma - gịnị bụ otu ihe ahụ? Ọ bụ inye ndị ogbenye ihe niile onye ahụ nwere? Echeghị m otú ahụ. Ọ bụ okwu nke ikpeazụ - okwu abụọ ahụ: "Soro M."

Enwere naanị otu ụzọ isi nweta ndụ ebighị ebi: soro Jizọs. Ndị Rom Isi Nke Atọ na-agwa anyị na

"Ọ dịghị onye a ga-agụnye dị ka onye ezi omume n’anya Chineke site n’ọrụ nke iwu” (Ndị Rom 3:20).

Nke ahụ pụtara na ime ọrụ dị mma ezughi oke.

“(Mana) a na-enye ndị niile kwere ekwe ezi omume site n'okwukwe ha na Jizọs Kraịst" (Ndị Rom 3:22).

N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, Jizọs n'eme ka anyị na Chineke dị n'nma mgbe anyi ji okwukwe n'eso Ya. Ọ buuru mmehie anyị gaa n'elu obe ma nye anyị ezi omume Ya (2 Ndi Kọrịnt 5:21).

Ya bụ na gịnị mere Jizọs ji gwa nwa okorobịa ahụ ka ọ ree ihe niile o nwere? Ka a na-ekwu, lelee mmeghachi omume ya:

"Ka ọ nụrụ nke a ịhụ ya wee daa. Ọ ji ọbi mwute wee laa, n’ihi na o nwere akụ̀ dị ukwuu" (Mak 10:22).

Ya bụ na ọ bara ọgaranya . Mmeghachi omume ya bụkwa ihe ngosi. Ọ wutere ya n’ihi na ọ hụrụ akụ̀ ya n’anya. Ego abụghị ihe ọjọọ, mana ịhụ ego n'anya dị ize ndụ. Akụ na ụba nwere ike ịghọ arụsị n'ụzọ dị mfe - ihe nọchiri anya Chineke. Eleghị anya, Jizọs gafere iwu ndị mbụ ahụ iji gosi nwa okorobịa ahụ na ọ na-eme otu ihe ahụ. Ma ọzọ, a ghọtara m ihe ọ jiri kpaa agwa otu ahụ. Echere m na m bụ ezigbo mmadụ, mana mpako bụ arụsị m, ọ gbochikwara m iru Chineke nso. Maka nwoke a, ego bụ arụsị ya. Ya mere Jizọs jiri sị ya: Buru ụzọ hapụ arụsị gị, mgbe ị mechara nke a, soro M.

Na-elekwa okwu Jizọs anya. Ọ na-akọwa Eluigwe dị ka "ịba n'Alaeze nke Chineke." Nke ahụ na-agbanwe ihe. Ọ bụrụ na Eluigwe bụ naanị ebe dị mma, mgbe ahụ iji baa n'ime ọnụ ụzọ ya, onye ahụ ga-abụriri onye dị nma; ma ọbụrụ na Eluigwe bụ ala-eze Chineke, iji bata, onye ahụ na Eze nwe ala ga-adị n'nma.

Jizọs bụ Eze, naanị ụzọ e si enweta Alaeze Chineke bụ iso Jizọs. Ọ dị mma, ọ bụkwa naanị Ya nwere ike ime ka anyị bụrụ ndị ezi omume. Ma ị nweghị ike iso Jizọs ọbụrụ na ị hapụghị arụsị gị. Ị nweghị ike ijere nna ukwu abụọ ozi, ị nweghịkwa ike iso nsuso n'ụzọ abụọ.

Gịnịzi mere nwa okorobịa ahụ? O mechaziri soro Jizọs, ka ọ̀ bụ na ọ nwetara ụwa ma tụfuo mkpụrụ obi ya? Anyị amaghị. Mana amaara m na oge ka fọrọ maka gị.

A na m eche otú Jizọs ga-esi zaghachi azịza ma ọ bụrụ na jụrụ Ya otu ajụjụ ahụ. Anyị niile nwere arụsị dị iche iche: ego, ụtọ, ọgwụ ọjọọ, ihe ịga nke ọma, mpako, agụụ mmekọahụ. Iji chọta arụsị gị, jụgodi onwe gị: Mgbe Jizọs na-asị “Soro M,” gịnị na-egbochi gị?

Gụọ Mak Isi Nke Iri, ma tụlee ihe i kwesịrị ịhapụ ka i nwee ike iso.

Maka Ntụleghachi & Mkparịta Ụka:

  • Olee akụkụ nzaghachi Jizọs zara ajụjụ nwoke ahụ n'ezie? (Gụọ 10:17 & 10:21).
  • Gịnị mere Jizọs jiri kwuo na ọ na-esiri ndị ọgaranya ike ịbanye n’Alaeze Chineke? (Gụọ 10:25).
  • Mgbe Jizọs na-akpọ gị ka i soro Ya, olee ihe ndị na-egbochi gị? Kekọrịta akụkọ gị.
Igodo: ụbọchị_isii ụbọchị_isii https://my.bible.com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/6

Okwu Chukwu

Ụbọchị 5Ụbọchị 7

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Start Here | First Steps With Jesus

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!

More

Anyị ga-achọ ikele Through The Word maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ozo, biko gaa na: http://throughtheword.org