Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ

Start Here | First Steps With Jesus

ỤBỌCHỊ 11 NKE 15

Ndị Kọlọsi 1:19-2:5 | Gụọ Ya

Nnọ nụ onye ọ bụla. Taa, anyị na-ekwu banyere Akwụkwọ Nsọ na mkpa ọ dị inwe àgwà ọma nke igụ Akwụkwọ Nsọ. Akwụkwọ Nsọ bụ otú Chineke si agwa anyị okwu, ịgụ Akwụkwọ Nsọ bụkwa otú anyị si anọgide n’ụzọ ziri ezi ka anyị na-eso Jizọs. Ọ bu ezie na ị hụla ndị na-ekwu na ha na-eso Jizọs mana ndụ ha adabaghị ka ha si ekwu. Ọ na-eme ọtụtụ mgbe. Yabụ kedu ka anyị ga-esi mee ihe n'ụzọ ziri ezi?

Akwụkwọ Nsọ bụ isi. Eji m n’aka na ị chọpụtala na njem a niile gbadoro ụkwụ na Akwụkwọ Nsọ. Akwụkwọ Nsọ dị ịtụnanya. Bụrụ akụko juputara na ihe dị egwu, ndị dike dị egwu, amamihe miri emi, na nduzi dị ike maka ndụ. Enwere ọtụtụ ihe ebe a. Na Akwụkwọ Nsọ na-emekwa ka anyị gbasie ike. Ọ na-enye anyị njigide nke eziokwu n'ime ụwa nke mgbagwoju anya jupụtara. E nwere ọtụtụ ụgha dị n'uwa - ọbụna ụgha banyere Jizọs - ma Akwụkwọ Nsọ na-eme ka anyị na-eje ije n'eziokwu na na-eso Jizọs nke bụ ezie.

Ya mere, ka anyị laghachi na ihe anyị na-akpa. Anyị kwụsịrị ná Ndị Kọlọsi 1 na-ncheta siri ike banyere onye Jizọs bụ. Ka anyị gaa n'ihu site n'amaokwu 19:

“N’ihi na ọ dị Chineke ezi ụtọ ka izuzu Ya dum biri n’ime Ya (Jizọs), na sitekwa n’aka Ya mee ka Ya na ihe nile dị ná mma.”

Nke ahụ dị ike. Uju niile nke Chineke dị n’ime Jizọs. Sitekwa n’aka Jizọs ka e mere ka anyị na Chineke dị ná mma. Mkpekọrịta na-ezo aka na mmekọrịta na-ezighi ezi emere ka ọ di nma. Anyị na Chineke na-eme udo...

"...site n'ọbara Ya, nke a wụfuru n'elu obe" (1:20).

Jizọs mere ka anyị bụrụ ndị ezi omume n’ebe Chineke nọ, Pọl chọkwara ka anyị nọgide n'ezi omume n’ebe Chineke nọ. Ya mere ọ na-agba gị ume ka ị...

"...nọgide n’okwukwe gị, na nguzosi ike na adaghi mba, na esikwala n’olileanya nke e doro anya n’ozi ọma pụo" (1:23).

Gịnị mere Pọl jiri kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ụlọ ụka Ndị Kọlọsi bụ nke e ji nkụzi ụghana ozizi ụgha banyere Jizọs a pia utari. Ndị aghụghọ batara. Ya mere Pọl jiri degaara ha akwụkwọ ozi iji mee ka ha guzosie ike n'eziokwu. N'amaokwu nke 25 ọ sịrị,

"Abụrụla m ohu ya site n’ọrụ Chineke nyere m ka m wetara unu Okwu Chukwu n’uju ya.”

Chineke nyere Pọl ọrụ ijere ndi nke Ya ozi site n'ịkụzi Okwu Chineke n'uju. Nke ahụ pụtara site na mbido ruo na njedebe nke Akwụkwọ Nsọ. Ọtụtụ mgbe, ndị ozizi ụgha na-ekwu ihe dị n'Akwụkwọ Nsọ, mana ha na-ewere otu amaokwu n'akuku ebe a na n'akuku ebe ozo na-atụgharị ha ka ha si chọọ. Ya mere, gụọ Akwụkwọ Nsọ n'onwe gị - ọ ga-eme ka ị nọrọ n'eziokwu na pụọ ​​na ụgha.

Ugbu a ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịghọta Akwụkwọ Nsọ, ọ bụ n'ihi nke a ka e ji nwee ezigbo ndị nkụzi. Chineke nyere ndị nkụzi ka ha nyee aka ikọwa na itinye Akwụkwọ Nsọ n'ọrụ. Mana onye nkụzi emekatakwala nọchie ọnọdụ Akwụkwọ Nsọ - ọrụ ya naanị bụ inyere gị aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ.

Laghachi azu ná Ndị Kọlọsi, ndị ozizi ụgha kwuru na eziokwu jupụtara n’ihe omimi ndị ị na-apụghị ịghọta. Ya mere Pọl jiri na-ekwu na Chineke ekpugheele ihe omimi ahụ - Ọ meele ka anyị mara ya. N'amaokwu nke 27, ihe omimi ahụ bụ

"...Kraist dị n’ime gị, olile-anya nke ebube."

Nke ahụ bụ ihe nzuzo nke bụ ezie. Akwụkwọ Nsọ bụ gbasara Jizọs. Ihe nzuzo nke ibi ndụ maka Chineke bụ "Kraịst n'ime gị." Ọ na-edu anyị site n’ime anyị site n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ihe niile anyị na-ako bụ maka Jizọs. Ya mere n’amaokwu nke 28, Pọl kwuru si,

"Ọ bụ Ya bụ Onye anyị na-ekwusa, na-adụ ọdụ ma na-akụziri onye ọ bụla n’amamihe niile... .”

Nkụzi dị mkpa n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ. Na ezi ozizi nke Akwụkwọ Nsọ na-ekwusakwa Jizọs. Ị ga-amara na ọ bụ ezi nkuzi ma ọ bụrụ na nlekwasị anya bụ Jizọs na ntọala ya bụ Okwu Chineke.

Gaa n'ihu n’isi nke 2, Pọl kọwara ihe mgbaru ọsọ nke nkụzi:

"Ebumnobi m bụ ka ha buru agbamume n’obi na dị n’otu n’ịhụnanya, ka ha wee nweta oke akụ nke nghọta zuru oke, ka ha wee mara ihe omimi nke Chineke, ya bụ, Kraịst.”

Lee anya, Pọl chọrọ ka ị ghọta Akwụkwọ Nsọ, n'ihi na mgbe ị ghọtara, ị ga-amata Jizọs. Ugbu a Akwụkwọ Nsọ jupụtakwara n’amamihe na ihe ọmụma, ma amaokwu nke 3 na-echetara anyị na "akụ̀ niile nke amamihe na ihe ọmụma" dị n’ime Jizọs.

Yabụ kedu ka anyị ga-esi nọrọ n'ụzọ ziri ezi? Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na anyị na-eso Jizọs nke bụ ezi ya? Na-agụ Akwụkwọ Nsọ ma na-ege ezigbo nkụzi nke Akwụkwọ Nsọ ntị.

Enwere naanị omume ole na ole dị mkpa nke iso Jizọs. Nke mbụ bụ omume zuru oke nke igụ Akwụkwọ Nsọ. Mara na igụ Akwụkwọ Nsọ abughi nzoukwu otu esi aga eluigwe, ọ bughikwanu ụzọ isi mee ka Chineke hukwuo gị n'anya. Ọ hụla gị n'anya nke ọma. Mana igu Akwụkwọ Nsọ ga-adọta gị nso na ịhụnanya ahụ, ma nyere gị aka ịghọta ya ma jee ije na ya. Ọ bụghị ihe ejedebere na ya, ọ bụ ihe a na-erute erute na ya. Cheta, Okwu Chineke bụ mkpụrụ - ọ na-akụ ndụ n’ime obi gị. Ya mere, kụọ ụfọdụ kwa ụbọchị!

Oleekwanu otú i ga-esi amalite àgwà nke igu Akwụkwọ Nsọ? Ọ bụrụ na ị nọ na atụmatụ a, ị malitewori mewe ya! Ya mere wepụta ntakịrị oge kwa ụbọchị iji gụọ Akwụkwọ Nsọ na ikpe ekpere. Ma n’ezie, gụọ Ndị Kọlọsi ugbu a, aga m ezutekwa gị azụ ebe a n’isi nke 2.

Ị hụrụ nke ahụ? Àgwà nke igu Akwụkwọ Nsọ amalitewo. Ọ dị mfe.

Maka Ntughari & Mkparịta ụka

  • Olee ọrụ omume na-aru na ndụ gị? Gịnị ka ị na-ahụ dị ka àgwà dị mkpa nke iso Jizọs?
  • Pastor Kris sịrị, “Akwụkwọ Nsọ na-eme ka anyị na-eje ije n’eziokwu na-iso Jizọs nke bụ ezi ya.” Olee otú i si chee na ịgụ Akwụkwọ Nsọ na-eme ka i mee otú ahụ?
  • Gịnị bụ ahụmahụ gị n'ịgụ Akwụkwọ Nsọ? Kekọrịta akụkọ gị.
Igodo: ụbọchị_11 ụbọchị_11
Ụbọchị 10Ụbọchị 12

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Start Here | First Steps With Jesus

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!

More

Anyị ga-achọ ikele Through The Word maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ozo, biko gaa na: http://throughtheword.org