Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Bido Ebe a | Nzọụkwụ Nke Mbụ Na JizọsIhe Atụ

Start Here | First Steps With Jesus

ỤBỌCHỊ 13 NKE 15

Ndị Kọlọsi Isi Nke Atọ | Emegharịrị N'Onyinyo Ya

Ndewo, na nno nu ndị enyi m. Anyị ji ajụjụ malite: Iso Jizọs ọ̀ bụ maka omume ọhụrụ ka ọ̀ bụ maka ibụ mmadụ ọhụrụ? Ọ bụ maka ibi ndụ dị iche ka ọ bụ ịdị iche. E kwuwe, azịza ya bụ ha abụọ - mana usoro ha na-eme ka ihe niile dị iche.

Laa azụ na Ndị Kọlọsi Isi Nke Abụọ, Pọl kọwara na ịgbaso Jizọs abụghị nanị usoro iwu e ji ebi ndụ, kama ọ bụ ndụ ọhụrụ. Lie nke ochie, yikwasi nke ọhụrụ. Ma taa n’isi nke atọ, ọ na-agwa anyị otú anyị ga-esi bie ndụ ọhụrụ ahụ. Amaokwu nke mbu:

"Ya mere, ebe e mere ka unu na Kraist si n’ọnwu bilie, tukwasinu obi-unu n’ihe ndị di n’elu, ebe Kraist nọ, ebe Ọ nọdu ala n’aka-nri nke Chineke. Tukwasinu obi-unu n’ihe ndị di n’elu, a bụghi n'ihe ndị di n'uwa."

Nke a bụ igodo ya: tinye obi gị - ma uche gị - n'elu. Chee echiche banyere Jizọs. Chee echiche banyere Eluigwe. Chekwaa akụ gị niile n'ebe ahụ. Tinye nnukwuta ego gị na akụ gị na Eluigwe. Mgbe ndụ na-ebuda gị n'ala, na-echeta mgbe niile ileli anya elu. Amaokwu nke atọ:

"N’ihi na ị nwụrụ, e zonahụkwala ndụ gị ugbu a n’ebe Kraịst nọ n’ime Chineke."

Nke ahụ masịrị m. "Ndụ gị bụ nke e zoro ezo." Ndị mmadụ ga na-eche ihe ọ bụ na-eme ka ị na-achake na ndụ - ma ọ bụ Jizọs. Ọ bụ Ya bụ ndụ gị.

Ihe ndị fọdụrụ n’isi nke abuo bụ banyere otu ihe: nwụnahụrụ ndụ ochie, bie ndụ ọhụrụ. Amaokwu nke ise:

"Ya mere, gbuonụ, ihe ọ bụla bụ nke ọdịdị ụwa di unu n'ahu: ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ na anyaukwu, nke bụ ikpere arụsị."

Lezienụ anya ka nke a si arụ ọrụ. Onye Kraịst na-akwụsị ime ihe ọjọọ - ọ bụghị site n'ịgbaso iwu, kama ọ bụ site n'igbu akụkụ anyị nke chọrọ ime ihe ọjọọ. Ya mere n'amaokwu asatọ:

“…Wepụnụ onwe unu… iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwutọ, na okwu rụrụ arụ n'egbugbere ọnụ unu."

Ugbu a ịkwụsị mmehie dị mfe ikwu karịa ime. Ya mere achọrọ m ịkwado ihe abụọ. Nke mbụ, mụọ Ndị Rom Isi Nke Isii ruo Isi Nke Asato. Isi ihe dị n'ebe ahụ bụ ka e jupụta na Mmụọ Nsọ.

Nke Abụọ, malite ezi omume nke ikwupụta mmehie gị nye Chineke na nye onye ị tụkwasịrị obi. James Isi Nke Ise kwuru nke a:

“Na-ekwupụtaranu ibe unu mmehie unu, na-ekpekwanụ ekpere maka ibe unu ka e wee gwọọ unu" (James 5:16).

Ngwọta site na mmehie na-amalite site na nkwuputa na ekpere.

Ma laghachi ebe a n'amaokwu nke itolu:

"Unu agwala ibe unu okwu ụgha, ebe ọ bụ na unu ewepụla ochie unu na omume ya, wee yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ, bụ́ nke a na-eme ka ọ dị ọhụrụ n’ihe ọmụma n’onyinyo nke Onye Okike ya."

Nke ahụ bụ obi ya. Yikwasi onwe ọhụrụ. Bụrụ onye ọhụrụ nke Chineke na-eme ka ọ dị ọhụrụ. Chineke na-agbanwe gị mgbe niile n'onyinyo Ya. Na Jenesis Isi Nke Mbu, Chineke kere mmadụ n'onyinyo Ya, mana mmehie mebiri oyiyi ahụ. E mesia, Jizọs wee bịa. Jizọs bụ onyinyo Chineke. Ma Ọ bịara dịka mmadụ inye anyị ndụ ọhụrụ na imeghachi anyị n’ime Ya, iweghachite anyị n’onyinyo e zubeere maka anyị.

Nke ahụ na-agbanwekwa ihe niile. N'amaokwu nke iri na otu, ọ na-emebi nkewa dị n'etiti anyị - nkewa nke agbụrụ, agba, okike, na ọkwa nke na-eme ka mmadụ kpọọ ibe ya asị, mmegbu, na agha. Ndị Galeshia Isi Nke Atọ na-ekwu si,

"E nweghị onye Juu ma ọ bụ onye Jentaịlu, ma ọ bụ ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya, e nweghịkwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị, n’ihi na unu niile bụ otu n’ime Kraịst Jizọs" (Ndị Galeshia 3:28).

Ọ nweghi onye ka ibe ya, nakwa anyi bụ otù n'ime Kraist. Ịdị n'otu bụ ọkpụkpọ anyị. Ndị Kraịst adaala mba na nke a ogologo oge, mana nke a bụ ọkpụkpọ anyị.

Ma Pọl na-enye anyị onyinyo nke ndụ ọhụrụ a, yiri uwe nke...

“…ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ na inwe ndidi."

N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, na-emeso ndị mmadụ omume otú Jizọs si mesoo ndị mmadụ omume. Gbagharakwa dị ka Chineke sịrị gbaghaara anyị. Na n'elu ihe ndị a nile - hụ ndị mmadu n'anya. Iso Jizọs bụ ịhụ n'anya.

A kpọrọ anyị ka anyị buru ndị udo, ya mere ka udo nke Kraịst chịa n’ime obi unu. A kpọrọ anyị ka anyị dịrị n’otu, ya mere ka anyị were obi umeala na-ejere ibe anyị ozi. Ị nwere ike ịchọpụta na ọtụtụ okwu na-akọwa onwe ọhụrụ gị bụ gbasara otu i si emeso ndị ọzọ omume. Onwe gị ohụrụ di n'ime gị na-emetụta otú i si emeso ndị ọzọ omume n'mpụta. Ya mere na-ejere ibe unu ozi n’ịhụnanya. Nke ahụ bụkwa àgwà ọhụrụ gị nke ọzọ: jeere ndị ọzọ ozi.

Ka a n'ekwu n'amaokwu iri na asato, mmekọrịta gị ka a na-eme ka ọ dị ọhụrụ n'ụlọ na n'ebe ọrụ. Alụmdi na nwunye nwere ihe ọhụrụ di na ha:

"Ndị nwunye, na-edo onwe unu n’okpuru..." and "Ndị di, hụnụ n’anya..." (3:18-19).

Ugbu a lezienụ okwu ndị a anya nke ọma, ma cheta ihe anyị gụrụ na Ndị Galeshia: nwoke na nwanyị hà nhata n’ime Kraịst. N'agbanyeghị nke ahụ, a na-akpọ di na nwunye ka ha dị nrube isi na dị nchụ àjà. Mana idobe onwe abụghị otu ihe di ka nrube isi. Idobe onwe bụ omume nkwanye ùgwù a na-egosipụta n'etiti ndị ha nhata, àgwà a na amanyeghi nmanye nke nyefe na nkwado. Idobe onwe bụ omume nke ịdị umeala n'obi nke ọma, igosi nkwanye ùgwù na nsọpụrụ. Nke ahụ bụ ọkpụkpọ oku dị elu nke nwaanyi no na di bụ Onye Kraịst.

A na-akpọ di ka ọ hụ n'anya. Ọ bụghị naanị mmetụta obi, kama ọ bụ ezigbo àjà. Hụ n'anya dị ka Jizọs, na-atọgbọ ndụ gị dum n'ala maka nwunye gị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, nwunye na-enyefe onwe ya, ebe di na-enye ihe ya niile. Maka nkọwa ndị ọzọ, gụọ Ndị Efesọs Isi Nke Ise na 1 Pita Isi Nke Atọ.

Ma maka taa, gụọ Ndị Kọlọsi Isi Nke Atọ. Ma malite ụfọdụ àgwà ọhụrụ - àgwà igu Akwụkwọ Nsọ, àgwà nkwupụta mmeghie gi, àgwà ije ozi - a bụghị maka ịghọ onye ọhụrụ, kama n'ihi na ị bụ onye ọhụrụ. E mewo gi ozo n'onyinyo Ya.

Maka Ntughari & Mkparịta Ụka

  • Gịnị ka i chere bụ iwepụ odidi ochie ahụ ma yikwasị nke ọhụrụ? (Amaokwu nke itolu ruo iri).
  • Olee mgbanwe ndị ị hụrụ na ndụ gị nke na-egosi na a na-eme ka ị "dị ọhụrụ" n'onyinyo nke Onye Okike gị? (Amaokwu nke iri).
  • Taa anyị gbakwunyere omume ọhụrụ abụọ: nkwupụta mmeghie na ije ozi. Gịnị mere ha ji dị mkpa?
Igodo: ụbọchị_iri na atọ ụbọchị_iri na atọ

Okwu Chukwu

Ụbọchị 12Ụbọchị 14

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Start Here | First Steps With Jesus

Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'igụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị na-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe a. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntuziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha ga-eji nwayọọ nwayọọ dụrụ gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke onye ọ bụla ma ọ bụ mkparịta ụka otu. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka ọ soro, gị esorokwa ọzọ! Igodo: gbasara gbasara Biko Rịba Amama - Onye anyị na ya n'arụkọ ọrụ ga na-emekwa ihe ngere ọdịyo "Gụoro M" maka ọdịnaya nke ihe ofufe anyị na-atụgharị maka asụsụ ahọpụtara! https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus https://my. bible. com/reading-plans/13502-start-here-first-steps-with-jesus/day/1!

More

Anyị ga-achọ ikele Through The Word maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ozo, biko gaa na: http://throughtheword.org